Lee ụmụnne abụọ na-eji akpụ emepụta ọkụ latrik na Gana

Favour Nunoo bụ onye ntaakụkọ BBC Pidgin zutere ụmụnne abụọ a ka ha na-egosi ihe ha mepụtara n'akpụ nke mere ka ndị agbataobi ha bido ịhụ akpụ n'ụzọ pụrụ iche
Nkenke aha onyonyo Kwesi na James na-egosi ihe ha mepụtara nke mere ndị agbataobi ha ji bido ihụ akpụ n'ụzọ pụrụ iche

Ụmụnne abụọ nọ na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Gana egosila ụwa na ị ga-ejinwu akpụ mepụta ọkụ latrik.

James na Kwesi Ansah mepụtara ihe ha kpọrọ 'JK2 table power' site n'ihe dịka plastiki, osisi nakwa waya si na kọpa.

Akpụ bụ ihe oriri a ma ama si na mpaghara ọdịda-anyanwụ Afrịka, nke ndị mmadụ na-eji emepụta nri dị iche iche.

Maka na ndị na-akọ ugbo na-emepụta akpụ karịrị ihe ndị mmadụ na-eri, ọtụtụ akpụ na-emebi.

Mana site n'ihe a ụmụnne abụọ a rụpụtara, ndị mmadụ ga-enwe ike iji akpụ mebiri emebi maọbụ ihe a tufuru n'ime akpụ wee mee ka ekwentị gị nweta ọkụ, mee ka ọkụ latrik nwuo nakwa tinye ọkụ na redio na ihe ndị ọzọ.

Nkenke aha onyonyo James Ansah na nwanne ya nwoke bụ Kwesi Ansah na-egosi etu ha si eji akpụ emepụta ọkụ latrik

James na Kwesi kwuru na ọ bụrụ na gọọmentị maọbụ ndị na abụghị ndị ọrụ gọọmentị kwado ha, na ha ga-enwe ike ịmepụta ọkụ latrik ga-enye ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ, ime obodo na ndị niile na-enweghị ọkụ latrik na Gana ọkụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionE nweghị ọkụ na-emebiri anyị ihe

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a