Akụkọ kachasị na-abalịa a: ntụlịaka nwereonwe ga-amalite-Ipob

Ipob si na ntuliala nnwereonwe eruola

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Amabeghị ebe onye ndụ Ipob bụ Nnamdi Kanu nọ

Otu Ipob ekwuola na ha ebidola biwe akwụkwọ mbinyeaka maka ntuliaka referandum.

Ọnụ n'ekwuru ndị otu a bụ Emma Powerful gwara BBC na nke a bụ agba mbụ n'ime agba atọ maka ntuliaka nnwereonwe Biafra nke o kwuru ga- eme na ngwụcha afọ.

A chụọla onyenkuzi OAU maka ebubondina maka ịgafe ule

Image copyright OAU/fb
Nkenke aha onyonyo OAU bụ mahadum dị n'ọdịda-anyanwụ Naijiria a mara ọfụma

Onyeisi Obafemi Awolowo University, Ile-Ife dị n'Ọsun steeti bụ Eyitope Ogunbodede, kwupụtara na mahadum ahụ achụọla onye nkụzị ha bụ Prof Richard Akindele, maka ịrịọ nwa akwụkwọ ya ndina iji mee ka ọ gafee n'ule.

Onyeisiala Buhari ebinyelaka na akwụkwọ mkpata na mmefu akụ maka afọ 2018

Image copyright Buhari/Twitter
Nkenke aha onyonyo Onyeisiala Buhari achịala ihe karịrị afọ atọ

Onyeisiala Muhammadu Buhari etinyela aka na Bọjeti afọ 2018 n'obi gọọmentị n' Abụja taa.

Dịka ọ na eme nke a Buharị kwara arịrị na ndị omeiwu sepuru ihe n'ego ehiwere maka ọrụ dị oke mkpa nke gụnyere ịrụ ọdọ ụgbọelu n'Enugwụ.

Ndị ọnụ na-eru n'okwu sị Trump ekwuola ar

Image copyright AFP/Getty Images
Nkenke aha onyonyo Trump katọrọ ụsọro esị abata mba US

Ndị mba ụwa agbakọla aka katọọ atụmatụ onyeisiala Trump ikewa ezinaụlọ site na iwu e ji abata mba US.

Onyeisiala mba UK bụ Theresa May na Pope Francis bụ ndi so kwuo nke a, sịrị na ya bụ amụma jọgbụrụ udele ma sigbuo nkakwụ.

N'egwuruegwu,

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Goolu a Ronaldo nyere Moroko emeela ka ọ bụrụ onye kachasị nye goolu na mpaghara Yurop n'ụwatụwa.

N'egwuruegwu taa, Moroko abụrụla mba mbụ si Afrịka agbapụrụ na Iko mbaụwa na Rọshịa.

Ronaldo tinyere otu goolu na nkeji anọ amalitechara ya bụ egwuruegwu mgbe ha na Pọtụgal kwatara n'ehihie a.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBiafra: Gịnị nọ n'ime Bọnka Ojukwu

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a