Kedụ ebe ogbunigwe si baa n'ụlọ ndị PDP n'Ebonyi?

Dave Umahi Image copyright Dave Nweze umahi/ Facebook

Aka na-achị Ebonyi steeti bụ Dave Umahi kpọrọ ọgbakọ mberede gbasara nchekwa ụnyaahụ maka ogbunigwe a hụrụ n'ụlọọrụ ndị PDP na steeti ahụ.

Umahi gwara ndị ntaakụkọ na nchọpụta ogbunigwe ahụ bịara dịka ihe ịtụnanya maka etu ndị pati na-anọghị n'ọchịchị si chọọ ịnata ọchịchị n'ụzọ ọbụla na ntuliaka na-abịa na 2019.

Umahi na-atụ aka na ndị nchekwa na kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ anaghị ahụ etu ụfọdụ ndị mmadụ na-anọghị n'ọchịchị si chọọ ịnata ọchịchị n'ike.

N'okwu ya; "Ndị uweojii chọtara ogbunigwe n'ụlọọrụ anyị bụ PDP ebe ihe niile ndị uweojii kwuru na-egosi a ogbunigwe ahụ emeela ochie nke pụtara na ọ ga-abụ ndị nọ na patị na-anọghị n'ọchịchị debere ya otu ụbọchị m mere ọgbakọ ebe ahụ mana.

"Ndị anyị na-atụ aka bụ ndị nọ na patị na-anọghị n'ọchịchị na-enweghi ọrụ ọzọ na-abụghị ija eze maka ntuliaka na-abịa na 2019 ebe ha chọrọ ịnata ọchịchị n'ike.

"Agwala m ndị nchekwa ka ha lebaa anya na ya bụ ihe mere ma gwa ndị ụlọọrụ ha n'ebe dị icheiche ebe anyị bụ gọọmenti ga-agwa onyeisiala."

Umahi katọkwara ndị na-egbu ndị mmadụ na steeti ahụ a na-eche na ha si steeti Krọs Riva dịka ọ rịọrọ ndị steeti ya ka ha chekwaa onwe ha site n'aka ndị mkpagbu.

Akụkọ ndị ozọ ga-amasị gị: