Ọljiria gbachiri ịntanet iji gbochie aghụghọ n'ule

Ụmụakwụkwọ ndị Ọljiria Image copyright Getty Images

Mba Ọljiria machiri intanet iji gbochie ụmụakwụkwọ nwere ule ịghọ aghụghọ n'ule kọleji n'ụbọchị Wenesde.

Gọọmentị mba ahụ machikwara iji ekwenti na akụrụngwa ndị e nwere ike iji n'ebe karịrị puku abụọ a mapụtara maka ule ahụ.

Igwe e ji ese foto nakwa igwe na-enyochapụta igwe.

Otu ụlọọrụ igwe mgbasa ozi bụ Algerie Telecom kwuru na ha gbachiri intanet 'iji soro iwu gọọmenti mara nke ebumnuche ya bụ ịhụ na ule akwụkwọ ndị kọleji gara nke ọma."

Dịka onyeisi otu jikọrọ ụlọọrụ igwe okwu na mba bụ Ali Kahlane jiri kọwa, a chọrọ ka ndị otu ha rube isi n'ihe gọọmenti kwuru.

Aghụghọ n'ule bụ nnukwu nsogbu na mba Ọljiria.

N'afọ gara aga, ndị nọ n'isi ọchịchị mara iwu ka a gbachie soshal midia mana nke a akwụsịghị nsogbu ahụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionUle ụlọ mkpọrọ

Isiokwu Ndị Emetụtara