Akụkọ kachasị n'Abali a: Igbo ajụla mmapụta ogige ebe a na-azụ ehi

Ndị Igbo akatọla atụmatụ ogige ebe a na-azu ehi

Ohaneze
Nkenke aha onyonyo Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'Igbo ajụla amụma gọọmentị etiti ịmapụta ala ebe a na-azụ ehị n'ala Igbo

Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'Igbo akatọọla atụmatụ gọọmentị etiti mapụtara ịrụ ogige a na-azụ ehi nke a kpọrọ 'ranch'na steeti iri na Naijria nakwa ịmapụta egọ karịrị otu ijeri naịra maka atụmatụ a.

SERA sị na ihe ndị omeiwu mere bụ mmegide ikike diri mmadu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị ụlọnta ọmeiwu Naịjirịa

N'aka ọzọ, otu kwụụrụ onwe ha bụ SERAP n'aha ịchafụ akatọọla agwa ndị omeiwu kpara site na ịkpachapụ ihe n'ego a mapụtara na Bọjetị afọ a iji rụọ ọrụ ndị mkpa na Naịjirịa

Ha kwuru na agwa ndị a kpara megidere ikike dịrị onwe nke ndị ala anyị.

Okwu ndị mbịambịa apụọla ụlọ omeiwu US

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụlọ omeiwu US chọrọ itinye anya na okwu kpasara ndị mbịambịa na mba ahụ

Ndị omeiwu Mba Amerịka ga-eme ntụlịaka gbasara okwu ịgbasa ezịnaụlọ ndị mbiaramiara na mba ahụ.

Onyeisiala ha bụ Donald Trump kwuburu na ha agaghịzị agbasa ndị ezịnaụlọ ha nọ na mba Amerika ịbata obodo ahụ.

Denmak na Ọsrelịa agbala onwe otu ọkpụ ọtụ ọkpụ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị Franse meribụrụ ndị Ọstralịa 2 -1

N'egwuruegwu Iko mbaụwa, Denmark na Ọstrelia ewerela otu ọkpụ gba onwe ha ọnye lawa onye lawa n'asọmpị ha gbara n'ehihie taa.

Ndị Ajentina na Kroeshịa ga-akwata n'elekere asaa nke abalị.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ikọ mgbe ọbụla

Lee ihe nkiri anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOAU achụọla onyenkuzi ha maka ebubo ndina maka ịgafe ule

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a