Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Super Eagles ọ ga emeri Aisland?

Ihe ndị dị mkpa n'ụtụtụ a

Sinati na Ekweremadu

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

Agbara Ekweremadu akwụkwọ na ụlọikpe maka ebubo ịma ụma leghere anya n'idepụta akụ na ụba ya na 2015

Omeiwu Ike Ekweremadu na Eyinnaya Abaribe etinyerela ọnụ na ebubo onyeisiala Buhari boro ndi omeiwu na ha kapụrụ ego e ji aru ọrụ dị mpka mgbe ha hazigharịrị Bojeti afo a.

Ekweremadu kwuru na ịrụchapụ ọdọ ụgbọelu Enugwu na ngalaba ndị ọzọ dị ya na ndị omeiwu ndị ọwụwa anyanwụ Naịjirịa mkpa.

Sineto Abaribe na onwe ya sị na ọ tụrụ ha n'anya mgbe ha nụrụ maka nkapụ ego a, ma kwuo ndị omeiwu ala Igbo ga-eme nzụkọ gbata gbata maka okwu a.

N'ebe ọzọ na Naịjirịa,

Ndị Shiite
Nkọwa foto,

Ndị Shiite n'Abuja ji akwụkwọ El-Zakzaky ebe ha na-agagharị

Akuko na-eru anyị ntị bụ na otu onye uweojii anwụọla na Kadụna steeti ebe ndị shi'hites ji okwute magbuo ya.

Agbakwara ụfọdụ ihe ọkụ n'gbaghara dara ebe ndị ofufe shi'hites ahụ mere ngagharị iwe maka onyeisi ha anwụchirị kemgbe 2015.

Na mba ofesi,

Sara Netanyahu nwunye onyeisiala mba Izrel

Ebe foto si, AFP

Akpụpụla nwunye onyeisiala mba Israel bụ Sara Netanyahu ịkpe maka ebubo mpụ na-ekwu na o jị ego gọọmentị kwụọ ụgwọ nrị o gotere.

Nwunye Netanyahu agọọla ebubo ndị a ebe ịkpe ahụ jisike aga nihu na Jerusalem.

N'egwuregwu,

Ndị Super Eagles

Ebe foto si, @NGR PRESIDENT/TWITTER

Taa ka anyị ga-ama ma Naịjirịa a ga alata maọbụ gaa ihu na njem ị bụlata ikomba ụwa

Super Eagles ga-ezute Aisiland n'ọgbọ egwuregwu Volgograd ma ọ kụọ elekere anọ nke ehihie

Ọ bụghị nke ụwe mara mma, dee nuu chapleti na mmiri.

Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile