Akụkọ kachasị n'abalị a: Naịjirịa nọ n'ụzọ agbaruola ihu maka ego e bere na bọjet Ndigbo

Ihe ndị dị mkpa n'abalị a

Super Eagles nke Naịjirịa emeriela 2 - 0

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ahmed Musa nyere Aisland goolu abụọ

Naịjịrịa na Island akwatara ya n'Iko mbaụwa na Rọshịa na mgbede a ebe Brazil gbara Costa Rica ọkpụ abụọ asataghị otu.

Aịsland riri penariti ha ebe Ahmed Musa nke Naịjirịa tinyere ọkpụ abụọ na ọnụ goolu ndị Aịsland.

DSS Jidere Sen Enyinnaya Abaribe

Nkenke aha onyonyo Enyinnaya Abaribe bụ onye na anọchite anya ndị Abịa Saọt na ụlọ omeiwu ụkwu Naịjirịa

Ozi na-eru BBC nti n'ehihie taa na-ekwu na ndị DDS akpurula Enyinnaya Abaribe.

Ka ọ dị ụgbụa ekwubeghị ihe ejiri kpụrụ ya mana BBC na-agba mbọ iwetere ụnụ ozi ya ka ọ na-apụta.

El-Zakzaky: Ndị Shi'ite egbuola otu onye uweojii na Kadụna

Na mba ofesi,

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mba Kongo gbara ndị 161 n'ime 175 bụ mba kacha eme mpụ na ngarị n'afọ 2017

N'mba ọzọ, US amachipụla ndị ọnụ na-eru n'okwu na mba Kongo bụ ndị na-etinye aka na-mpụ na nagarị dị iche iche ịbata be ha.

Naịjirịa nọ n'ụzọ agbaruola ihu maka ego e bere na bọjet ndị Igbo

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị ọmeiwu Naịjirịa

Otu kpọrọ onwe ha ọgbakọ ụmụnna nọ na Kanada etiela ndị nnọchite anya ndị Igbo n'ụlọ ọmeiwu Naijịrịa mkpu n'isi ka ha bụ okenye siri nọrọ n'ụlọ ewu mụọ n'ọgbụ.

Obi adịghị ndị Igbo mma kemegbe Onyeisiala Mụhammadu Buhari kwuchara na ndị omeiwu a chapụrụ ihe n'ego etinyere na bọjeti maka ọrụ mmepe n'ala Igbo.

Gee nkeji nke abalị a ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMkparịtaụka ebe Sinetọ Abaribe kọwapụtara iwe ndị Igbo ebe onyeisiala Muhammadu Buhari nọ.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a