Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Lee onye nwere ike ịchị APC

Oshiomhole ọ ga-abụ onyeisi ọhụrụ otu APC?

Image copyright Adams Oshiomhole facebook

Tata ka otu pati na-achị Naịjirịa bụ APC ga-eme nzụko ukwu ha ga-eji ahọpụta onyeisi oche na ndị ndu ha

N'ihu nhazi nzụkọ a, onye chịbụrụ Edo steeti bụ Adams Oshomole enwetara nkwado onyeisiala Buhari na onyeisi APC bụ Bola Tinibu ịbụ onyeisi oche.

DSS ka nwuchiri Abaribe

Onye omeiwu na-anọchịte anya Abịa Sawụtụ bụ Eyinnaya Abaribe na ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa ka nọkwa na-aka ndị DSS.

Onwebeghi ihe asị na ọ bụ maka ya ka eji ejide omeiwu a, mana ndị PDP, na ohaneze ndị Igbo si na nke a ekwesịghị ime na ọchichi onye kwuo uche ya.

Gụọ akụko a n'uju ebe a.

Okwu Trump na Kim na-aga ọfụma

Image copyright Getty Images

Na mba ofesi, Mba Amerika ekwuola na ha ga-akwụsị emume nkwado agha ha na-eme na Sawụtụ Kọria.

Ọnụ na-ekwuchitere mba Amerika n'ihe gbasara nchekwa obodo bụ James Mattis kwuru na ha were mkpebi a maka nkwekọrịta Amerika na Nọt Koria nwere n'ụbọchị ole na ole garaaga.

Image copyright Getty Images

N'egwuregwu iko mbawa

Ụmụ Naijiria ka na anwụrịkwa maka mmeri Ahmed Musa nyere ha ụnyaahụ

Mana egwu ka dikwa taa, ka Beljịọm ga-ezute Tunishia, ebe Saụt Koria ga-ezute Mekziko.

Nke ikpeazụ ga-abụ nke Jamini na Swidin n'elekere asaa nke abalị taa.

Gee akụkọ anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri nke tata bụ nke nwoke na esi ofe onugbu ọfụma. Kerie ya ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOfe onugbu