Obodo Abonnema dị na Rivas steeti na-echeta etu ha si jụ Biafra afọ 50 gara aga

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionObodo Abonnema dị na Rivas steeti na-echeta etu ha si jụ Biafra afọ 50 gara aga

21 June 1968 bụ ụbọchị ndị obodo Nyemoni nke a makwa dịka Abonnema dị na Rivas steeti, na-agaghị echefu echefu.

Ọ gaghị agba ha nchefu maka na ọ bụ ụbọchị ndị agha Biafra wakporo ha, ma kpụrụ ụfọdụ ndị obodo ha kpụga na mpaghara ọwụwa-anyanwụ, ebe ndị Igbo bi.

Akụkọ kọrọ sị na ha kpụgara ndị mmadụ n'ụkwụ osimiri Niger, ebe ha tinyere ha n'ụgbọmmiri bu ha pụọ.

Akụkọ kwukwara na ndị agha Biafra kpụrụkwara onye bụ eze ha oge ahụ bụ Davies Bobmanuel.

Eze Bobmanuel rịọrọ ndị agha sị ha kpụrụ naanị ya pụọ kama ha ga-akpụrụ ndị obodo ya, mana ha jụrụ ajụ.

Dịka akụkọ si kwuo, ka ọ na-eweta aka ebe elekere 12 nke ehihie, ndị agha Naịjirịa batara obodo Abonnema iji lụso ndị agba Biafra agha nakwa gbatara ndị Abonnema ọsọ enyemaka.

Ndị agha Naịjirịa si n'obodo Buguma bata Abonnema. Na-egbughị oge, ha chụpụrụ ndị agha Biafra ma gbapụta ndị Abonnema n'aka ha.

Nkenke aha onyonyo Ndị Abonnema na-ejike ka ndị na-eme ejije kwa afọ iji gosi ihe mere afọ 50 gara aga

Site n'oge ahụ ruo ugbua mere ya afọ iri ise (50) ihe a mechara, ndị obodo Abonnema na-eji ụbọchị 21 nke ọnwa Juun echeta mgbapụta a gbapụtara ha n'aka ndị Biafra.

N'ụbọchị ahụ ha na-akpọ 'Go to Niger', ha na-eyi ejiji dịka agha, nakwa ndị nkịtị, iji mee ejije maka ncheta ụbọchị a.

Obodo niile na-esonye n'inwe aṅụrị kwa afọ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ebe ndị agha Naịjirịa na-atụ alo na Port Harcourt oge agha n'afọ 1968

Onye bụ Amanyanabo nke Abonnema bụ Eze Disrael Gbobo Bobmanuel, gwara BBC Pidgin na afọ a mere ya afọ 50 ihe a mere. O kwukwara na ha na-eji emume a eme ka ndị na-etolite ugbua a ghara ichefu ihe ọma Chineke meere ha.

O kwuru sị "Anyị na-ekpesi ekpere ike ma na-akọkwara ndị ntorobịa ugbua akụkọ gbasara ihe mere oge ahụ; na-agwa ha ka ha mere udo enyi ma na-ekpesikwa ekpere ike".

O kwukwara sị "Abonnema esoghị na Biafra. Anyị kwenyere na ndịnotu Naịjirịa, ya mere anyị achọghị nkewa ya."

"Anyị bụ ndị eze na-achị obodo, ihe anyị chọrọ bụ ka obodo anyị dị n'udo ma nwee ọganihu."

Akụkọ ga-amasị gị: