Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ipob enyela gọọmenti iwu maka Abaribe

Akụkọ dị mkpa

Ipob members

Ebe foto si, Getty Images

Ipob enyela gọọmentị etiti ụbọchị abụọ ka ha tọghapụ Sịnetọ Enyinnaya Abaribe bụ onye ndị nchekwa DSS nwuchiri abalị atọ gara aga ma ọ bụ ha gosipụta iwe ha.

Onye ode akwụwkọ ha bụ Emma Powerful kwuru na gọọmentị ekwubeghị eziokwu ihe ha jiri nwụchie Sịnetọ a.

Buhari Arịọla ka-eme udo na Plateau Steeti

Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala bụ Mohammadu Buhari akpọọla oku ka ebe niile daa jụụ n'ime ọgbaghara dị n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị ọchi ehi na Plateau Steeti.

Ndị uweoji kwuru na ọgba aghara a nke malitere n'izuụka gara aga ataala isi mmadụ iri asatọ na isi.

Mmiri eriela nwa Dbanj

Otu nwafọ Naịjirịa ama ama n'iti egwu bụ Dbanj ebeela akwa ụwa ya maka ọnwụ nwa ya nwoke bụ Daniel Oyebanjo bụ onye ọdọ mmiri nọ n'ime ụlọ ha riri ụnyaahụ.

Nwata ahụ gbara otu afọ n'ọnwa Mee gara aga.

Egwuregwu

Ndị Rọshịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ndị mba Rọshịa

Dịka agba nke mbụ asọmpi Iko Mbaụwa na-akwakọrọ ọnụ, otu bọọlụ dị iche iche na-agba mbọ ị hụ na mba ha gara n'ihu n'asọmpi a.

N'ehihie a, Ndị Yuregua ga-ezute Rọshịa n'otu oge ahụ ndị Saụdi Arebịa na Ijiptu ga-achịpụwa.

Nke nke ụtụtụ a:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Aha onyonyo,

Obodo Abonnema dị na Rivas steeti na-echeta etu ha si jụ Biafra afọ 50 gara aga