Plateau: 'Ha gburu nne m, nna m, nwunye m na ụmụ m'

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Ebekasịrị ụmụaka erughi afọ ise isi na olu'

Ndị mmadụ apụtala ị mee akaebe maka mkpa mkpa para na Platu steeti ụbọchị ole na ole gara aga.

Chukwuemeka Eze bụ dibia bekee nọ n'ụlọọgwụ mgbe ebubatara ndị mmerụrụ ahụ kọwara BBC ihe ọ hụrụ.

Ọ sị na ebe niile n'esi ka ebe a na-abọ anụ n'ehihie ahụ n'ụlọgwụ mahadum nke Jọs ma tinye kwuo n'ọnụgụgụ ndị merụrụ ahụ kariri mmadụ iri ise.

Onye ọzọ ihe a metụtara bụ Ezekiel Danbwarang akọwarala BBC etu ndị ọchịehi siri gbuo ezinaụlọ ya.

"Ha tịkara ọnụ ụzọ m wee bata, m nụzie ụda egbe na mkpu nwụnyere m tiri m jiri mara na ha egbuola ezinaụlọ m"

N'ọnụ ya "Mgbe ha buuru ihe niile dị n'ime ụlọ m ka ha malitere gbaa ya bụ ụlọ ọkụ".

Nkenke aha onyonyo Eserese gosiri mpaghara etiti Naịjirịa nsogbu a metụtara

Ndị uweojii agaala Jos

Ụnyaahụ, onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris zigara ụfọdụ ndịuweojii na ụgbọelu helikọpta abụọ na Barkin Ladi na Riyom.

O zigakwuru ụgbọagha ise na ndị uweojii pụrụiche akpọrọ "police mobile force unit" tinyere ndị o zipụburu.

Ka ọ dị ugbua, onyeisiala Muhammadu Buhari edepụtala akwụkwọ ebe o kwuru na ụfọdụ mmadụ emeela ihe a ihe ndọrọndọrọ ọchịchị

Ọ rịọrọ ndị nsogbu a metụtara ha nwee ndidi ka iwu ala mezuo ọrụ ejiri hiwe ya.

Image copyright Chuwang Dalyop
Nkenke aha onyonyo Amabeghị ezi ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ihe a ebe ụfọdụ na-ekwu na ọ gafere narị abụọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: