Ị chọrọ ịzụ ntutu gị? Lee etu ị ga-esi me ya n'ime usoekwu gị

Ntutu Image copyright Game Of Fros/ Instagram

Ndị ọkachamara n'ihe gbasara ịzụ ntutu ekwuola n'ihe kacha mkpa na-eme ka ntutu mmadụ too ọkachasị ndị Afịrịka bụ iri ezigbo nri.

Nke a pụtara na ọ bụrụ na mmadụ na-eri nri zuru ezu, ntutu onye ahụ n'akụkụ ahụ ya niile ga na-anata ihe ọ ga-eji na-eto.

Ugbua ndị Afịrịka na-etinye uchu na ịzụ ntutu ha etu ọ dị karịa ite ya kemikal, ọtụtụ nchọpụta adịla n'ihe e ji azụ ntutu na-anaghị emerụ ahụ maọbụ nwee ihe mmekpa ahụ ọbụla.

Nke a mere na ọtụtụ ihe e ji eme isi bido na nke e ji asa ya asa rue na nke e ji eme ka ọ dị juu dị n'ime ụsọekwu.

Lee ihe ntutu gị chọrọ n'ime ụsọekwu gị

1. Mmiri: Ndị Igbo na-ekwu na mmiri enweghi onyeiro. Onweghi onye enweghi mmiri n'ụlọ ya maọbụ n'ụsọekwu ya, ịnụ mmiri nkeọma anaghị edozi ahụ naanị ya, ọ na-eme ka ntutu gị nwere mmiri zuru oke ọ ga-eji na-adị jụụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mmiri enweghi onye iro

Ndị ọkachamara n'ihe gbasara ntutu ekwuola na mmiri bụ otu ihe dị mkpa na ntutu mmadụ nakwa n'akụkụ ahụ mmadị niile.

Mana otu ihe ọtụtụ ndị mmadụ anaghị enwetacha bụ na ha na etinye mmiri n'isi ha naanị ya chefuo itinye n'ime ahụ ha site n'ịnụ ya anụ nke dịkwa mkpa ka ibe ya.

Ị na-achọ ka ntutu gị too eto, ịnụ mmiri dị mkpa ebe ị ga-agbakwa mbọ hụ na ị nwere iko i ji agba mmiri na ntutu gị oge niile o ghere oghe ka ọ ghara ịkpọ nkụ sie ike maka itibisi.

Image copyright Getty Images

2. Mmanụ: Mmanụ dị icheiche ka a na-enweta n'ụsọekwu dịka mmanụ akị Bekee, mmanụ "Olive" na mmanụ akwụ. Maka ntutu, ihe anyị ga-ekwu maka ya bụ mmanụ akị Bekee na mmanụ "Olive".

Ndị ụfọdụ na-ejikwa mmanụ akwụ mana anyị agaghị ekwu maka ya.

Image copyright Getty Images

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ata akị Bekee maka na ọ na-atọwa ntị mana ọbụghị naanị ịta ka a na-eme ya. A na-ejikwa ya eme mmanụ e ji esi nri nakwa e ji eghe ihe mana e jikwa ya eme isi.

Otu ihe mmanụ na-arụ bụ inye aka jide mmiri ị na-aṅụ na nke ị na-etinye na ntutu gị. Ọ na-emekwa ka ntutu na-enwuka enwuka n'ala isi.

Mmanụ Olive dịkwa mkpa nke ukwu maka na ọ na-aba n'ime ntutu ma jide mmiri nke ọma.

Ihe nke a gosiri bụ na ọbụghị naanị ndụ gị ka ị ga na-atụ mmanụ, ị ga na-atụkwa ntutu gị mmanụ.

3. Mmanụ aṅụ: Ọbụghịzikwa naanị nracha maọbụ iji rie nri, mmanụ aṅụ nwere ọtụtụ akụrụngwa na-eme ọ ji bụrụ akwa a kwụrụ n'ebe ahụike nọ.

Mmanụ aṅụ na-arụ ọtụtụ ihe dị icheiche mana nke gbasara anyị ugbua bụ maka ntutu.

Image copyright Getty Images

Otu onye bụ ọkachamara n'ihe gbasara ntutu bụ Chinyere Okolo kwuru na mmanụ aṅụ bụ otu ihe ntutu na-anara na-anaghị akarị akarị.

Mmanụ aṅụ na mmanụ Olive bụ akụrụngwa abụọ ị ga-eji mee ka ntutu gị daa jụụ ghara ịra ahụ ịvọ.

Were ọkara iko mmanụ anụ, tinye ya n'ime otu ngaji mmanụ, gwọkọọ ya ma tee ya na ntutu gị niile rue n'ala isi gị. Were okpu nchemmiri kpuchie ya buo ya rue ihe dịka nkeji iri abụọ tupu ị sapụ ya.

Nke a ga-eme ka ntutu gị bụrụ a kwaa akwụrụ.

4. Akwa: Nke na-amasị ọtụtụ ndị mmadụ mana ọtụtụ anaghị enweta etu e si eji ya eme isi.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ị ga-akpacha anya etu isi etinye akwa n'isi maka imebi ihe

Akwa bụ otu ihe na-eto ntutu maka akụrụngwa protin dị ya.

Mana ọbụghị akụkụ akwa niile ka mmadụ kwesiri itinye n'isi. Ụdị ntutu mmadụ nwere ga-ekwu akụkụ akwa ọ ga-etinye n'isi.

Nke a pụtara na onye nwere ntutu na-akpọ nkeụ oge ọbụla ekwesighi itinye akụkụ na-acha ọcha n'isi ya.

5: Ube oyibo: Nke a na-amasị ọtụtụ ndị na-eme isi maka na ube oyibo nwere mmanụ dị mma maka ntutu.

Image copyright Getty Images

Ube abụụghịkwa naanị maka ịracha aka, i nwereike iji shie ntutu gị eshi, o ghee eghe.

Ị ga-apịrịnwu ube tinye ya akụrụngwa ndị ọzọ jiri ya tinye n'isi, bue ya ụfọdụ oge tupu ị sapụ ya.

Ihe ndị ọzọ i nwereike iji mee isi

  • Viniga
  • Mmịrị ara ehi
  • Jinja
  • Galik
  • Akwụkwọ mint wdg...

Agbanyeghị ihe ọbụla mmadụ tinyere n'isi, otu ihe dị ezigbo mkpa. Ọ bụrụ na ị naghị eri ihe nke ọma, ị mara na otu abụghị n'ezi.

Rie nri nke ọma maka na ihe tinyere n'ahụ ga na-apụta na-egosipụta n'akụkụ ahụ gị niile.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionUru ịkpa isi bara

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a