Plateau: Nkwekọrịta Buhari, Saraki na Dogara nwere

Buhari, Saraki na Dogara Image copyright @NGRpresident
Nkenke aha onyonyo Mkparịta ụka ha na-abịa n'ime abalị anọ awakpochara ụfọdụ dị mmadụ ma gbuo ihe ruru mmadụ iri asatọ na isii na Plateau Steeti

Onyeisiala Buhari na ndị isi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki na Yakubu Dogara nwere mkparịta ụka taa.

Onyeisiala kọwara ndị isi ụlọomeiwu ihe ndị ọ na-eme i ji gboo nsogbu nchekwa dị na Naịjirịa ugbua.

Na ngwụcha nzụkọ ha, onyeisi ụlọomeiwu ntaa bụ Yakubu Dogara gwara ndị ntaakụkọ na okwu nchekwa abụghị okwu a na-ekwuputa n'ihu ọha.

Ọ gara n'ihu kwuo na onyeisiala gwara ha na ọ ga-ekpogharị nchekwa ala Naịjirịa.

Image copyright @NGRPresident
Nkenke aha onyonyo Onyeisiala Buhari na ndị isi ụlọimeiwu bụ Bukola Saraki na Yakubu Dogaran na-enwe mkparịta ụka

O kwuru na agbanyeghi na ugbu a bụ oge iri uju, na ndị Naịjirịa agaghị a na-abata ọnọdụ enweghị nchekwa.

Dọgara n'aha ndị ụlọomeiwu zigara ezinaụlọ ndị ihe a metụtara ozi iti aka n'obi.

Onyeisiala Mohammadu Buhari kwupụtara nzụkọ ahụ site n'akara twitter ya.

Mkparịta ụka ha na-abịa n'ime abalị anọ awakpochara ụfọdụ ndị mmadụ ma gbuo ihe ruru iri asatọ na isii na Plateau steeti.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: