Akụkọ kachasị n'abalị a: Grace Mugabe chọrọ igbu m - Mnangagwa

Akụkọ dị mkpa;

Emmerson Mnangagwe ekwuola na Grace Mugabe chọrọ igbu ya.

Onyeisiala mba Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa ekwuola na ọ bụ ndị otu nwunye onyeisi mba n'oge gara aga bụ Grace Mugabe chọrọ ị ji ogbunigwe gbagbuo ya.

Cheta na mmadụ abụọ nwụrụ, ebe mmadụ iri anọ nwere mmerụ ahụ n'ogbunigwe gbara oge ọgbakọ ndọrọ ndọrọ n'ala ahụ.

Buhari, Saraki na Dogara emeela mkpebi maka nsogbu dị na Platu Steeti:

N'ihi ogbugbu ọtụtụ ndị mmadụ na Platu Steeti, onyeisiala bụ Mohammadu Buhari na ndị isi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki na Yakubu Dogara nwere mkparịta ụka ime ụlọ taa.

Na mkparịta ụka ahụ, Buhari gwara ha na o bu n'obi ikpogharị ọrụ nchekwa na Naịjirịa.

Ọgbaghara atala isi mmadụ ruru narị atọ n'Ebonyi/Krọss River Steeti:

Nkọwa foto,

Ndị mmadụ bu akpa ha agbapụ ọzọ agbaga obodo ndị ọzọ

Ndị obodo Igbeagụ dị n'Ebonyi Steeti agbala ọsọ ndụ na-eleghi anya n'azụ maka nsogbu dị n'etiti ha na ndị Ukelle nke Kross Riva Steeti n'ịzọ oke ala.

BBC Igbo chọpụtara na esemokwu ahụ bụ nke malitere kamgbe afọ 2015 atala isi mmadụ ruru narị atọ.

N'egwurewgu:

Mba Jamịnị bụ ndị ji bu Iko Mbaụwa agwakọrọla laa na nke afọ a dịka Saụt Korịa gbara ha ọkpụ abụọ asataghị otu

N'aka nke ọzọ sweden gbara Mexico ọkpụ atọ mana mba abụọ ndị etozuola oke n'agba abụọ nke asọmpị a.

Nkeji Nke abalị a:

Aha nkeananụānụ,

BBC Nkeji

Ihe nkiri nke taa:

Aha onyonyo,

Nwa bebi a ka m ji achụ obi mgbawa so ụmụnwaanyị