Ndị Biafra Zionists: 'Ikpe ha dịzị n'aka ọkaiwu nke steeti'

Ipob na Massob Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị Biafran Zionists so na ndị chọrọ Biafra nke ọhụ

Ndị uweojii Enugwu steeti agọpụla aka na ukwu ha n'okwu gbasara onyeisi otu Biafra Zionist Federation bụ Ben Onwuka, onye ha nwụchiri ya na mmadụ 20 ndị ọzọ maka ịga konye ọkọrọtọ(flag) Biafra n'obi Gọọment Enugwu steeti iji mee emume Ncheta Biafra n'ubọchị Mee 30.

Ndị otu Biafra Zionists Federation, bụ otu n'ime otu na-achọ ka ekewapụta mba Biafra site na Naịjirịa mere ngagharị iwe na gbụrụgbụrụ ụlọikpe dị n'Enugwu ụnyaahụ bụ Wenesde maka na ndị uweojii akpọpụtaghị onyeisi ha bụ Benjamin Onwuka n'ụlọikpe.

Mana na mkparitaụka BBC na ọnụ na-ekwuru ndị uwe ojii n'Enugwu bụ Ebere Amaraizu nwere, o kwuru na "Aka ndị uwe ojii adịghịzị na ikpe ha kama ọ dị n'aka ọkaiwu nke Enugwu steeti(Attorney-General).

Ndị uweojii nwụchịkọrọ Onwuka na mmadụ 20 ndị ọzọ ka ha na-achọ iwakpo obi gọọmentị nke Enugwu.

Uweojii kwuru na mkpebi ndị a gara obi gọọmentị a bu ka ha konye ọkọrọtọ Biafra n'ebe ahụ iji me emume "ncheta Biafra".

Ka anwụchịkọrọ Onwuka na ndị otu ya, ndị uweojii kpụpụrụ ha ụlọikpe Enugwu East ka ha ga zara ọnụ ha.

Onwuka na ndi ọzọ gọrọ ebubo a eboro ha, mana, ka abịara ụlọ ikpe ahụ na Wenesde ha anọghị n'ụlọ ikpe.

Ọnọdụ a were ndị nkwado Onwuka na ndi otu ya bịara igere ikpe ahụ iwe kpatara ha jiri malite ngagharị iwe.

Onye bụ osote onyeisi ndị Biafran Zionist Movement bụ Ambrose Ugwu, gwara ndi ntaakụkọ na uche ha bu na ọkaikpe ga atọghapụ ndị otu ha mana nke ahu emeghi.

Ọ gara n'ihu jụọ "ihe ndị mere ejiri kpọsa ha na mkpọrọ."

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a