'Ihe tinyere m n'ọnọdụ a' - Onye eboro na ọ tụrụ ogbunigwe na be Nwodo

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnye eboro ebubo

Otu n'ime mmadụ abụọ ndị uweojii nwụchịrị maka ogbunigwe atụrụ na be onyisi ndị Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo agọọla aka na ọkpa.

Ekene Okechukwu gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo mgbe ndị uweojii kpụpụtara ya na ndi ọzọ ha nwụchịrị na aka ya adịghị na ya bụ mkpamkpa.

Cheta na ndị uweojii sị na Okechukwu na onye ha si bụ onye otu ya aha ya bụ Amah Gabriel bụ ndị tụrụ ogbunigwe n'ulọ Nnia Nwodo bụ onyeisi Ohaneze Ndigbo na April 29 afọ a.

Gabriel gọrọ sị na ya abụghị onye ohi, na nani ihe ya mere bụ izịgara chief Nnia Nwodo ozi na-ekwentị ya kwa mgbe kwa mgbe na abara ya mba ka ọhapụ ụmụ Ipob aka.

Okechukwu gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na aka ya adịghi n'ihe a mere, ma kwukwa na ya bụbụ onye uweojii.

kọmishọna uweojii n'Enugwu bụ Dan-mallam Mohammed onye gosipụtara ndị ahụ n'ihu ndị ntaakụkọ kwuru na ha ga-ekpochapụ ndị ji egbe aga ohị nakwa ndị omekaome dị icheichen'Enugwu.

Amah sị: "A na m arịọ mgbaghara n'ihi na amaghịm onye Nwodo bụ, ọ bụ n'igwe okwu nke Biafra ka m nụrụ akara ekwentị ya were zipụ ozi ahụ."

Image copyright Enugu STate Police / Twitter
Nkenke aha onyonyo Nwodo na onye uweojii

Cheta na atụrụ ogbunigwe n'ụlọ Nnia Nwodo n'obodo Ukehe n'Enugwu n'ọnwa Eprel.

Ndị IPOB gọrọ n'aka ha adịghị n'okwu ahụ.

Nkenke aha onyonyo Ndị otu ndị aka ji ndị uweojii kpọpụtara igosi ndị ntaakụkọ dị ise

Otu ndị ohi ha jidere dị ụzọ ise.

N'aka ọzọ, ndị uweojii gosikwara otu nwoke bụ DSP n'prison ya na ndi otu ya na ekweghị ndị Enugwu ṅụọ mmiri tọgbọ iko.

Ya bụ Dsp aha ya bụ Collins Ugwu bụ onye ejidere ebe ha na-ezu ohi ma napụtakwa ha ụgbọala ha zuru ezu.

Ya bụ onye ọrụ prisons na ndị otu ya na esoro ndị sị na ụlọakụ puta, laa n'ụlọ ha gaa were egbe nara ha yabụ ego, ma gbagbue onye ahụ ọtụtụ mgbe.

Onye isi abaokpu ọzọ ejidere bụ michael Anthony onye Aninri, nke tachịrị obi tọrọ nwata akwụkwọ Ifeyinwa Ugwu na 13 May 2018, machaa ya elu n'ike ma gbuo ya, lịkwaa ya na obere ili.

Onye ohi ọzọ bụ ndị jị keke napep ebu ngwongwo ndị mmadụ bụ Amoke Mathew na Solomon Nwankwo ndị sị Abakalịkị.

Ejidere ha ebe ha bụ Armored cable ha zuru n'ohi were na aga ebe ha ga ere ya.

Ohi Armoured cable bụ nke na ewu ewu n'Enugwu ugbua nke na ha na-aga na ọtụtụ ụlọ nta akụkọ n'Enugwu ga bechasịa ya bụ ụdọ ejị agbasa ozi.

Otu nwatakịrị dị afọ iri na isii aha ya bu Nzubechukwu, ka ejidere dịka onye na edobere ndị otu ya egbe, igwe computer, ekwe ntị, ego nakwa otụtụ ihe ha zuru ezu.

Komishọna Dan-Malam kwere nkwa na ndị ajọ mmadụ enweghị ebe ezumike n'Enugwu steeti.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a