Ogbugbu Plateau: Ihe Soyinka na ndị ọzọ na-ekwu ugbua
Plateau: Anya m hụrụ ihe dị egwu
Ka mkpa mkpa kpara na Plateau steeti ka na-ewu otu dị icheiche na mpaghara Naịjiria niile tinyere ọnụ n'okwu a.
Ndị ụkọchukwu ụka dị icheiche, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị Naịjirịa ama ama pụtara ị gosi iwe ha maka oke ogbugbu ụmụ mmadụ na Platu.
Lee ndị kwuru ihe nakwa ozi ha ziri gbasara okwu Platu a.
1. Ndị ụkọchukwu Kristi
Ndị ụka Kristi bụ ndị ọ kachasị metuta na nsogbu a, ya mere ndị ụkọchukwu dị icheiche jiri pụta ị katọ okwu a.
Poju Oyemade kwuru na nchekwa obodo kacha mkpa karịa ị hazi akụnaụba obodo ọbụla.
Sam Adeyemi rịọrọ ndị agha na ndị gọọmentị ha chọpụta ndị mere ihe ma kpe ha ịkpe zuru oke.
2. Otu ndọrọndọrọ PDP
Ebe foto si, PDP Official Facebook page
Otu ndọrọndọrọ PDP bụ ndị kachasị ama gọọmentị a aka n'ihu katọrọ ogbugbu ndị mmadụ na Platu.
Ha gwara ndị Platu ha gba mbọ kpụpụ gọọmentị ụlọịkpe mba ụwa akpọrọ International Criminal Court na bekee n'ihi na ọ bụ oke ruru ha.
Ha tinye kwara mba asaa ma wetuo ọkọlọtọ ha iji kwanyere ndị nwụrụ ugwu ruru ha.
3. Wole Soyinka
Ebe foto si, AFP
Onye ode akwụkwọ ama ama bụ Wole Soyinka kpọrọ gọọmentị etiti ha jiri aka ike soro ndị ọchịehi na-egbu ndị mmadụ.
O kwuru na ndị ahụ kara obi egbu ndị mmadụ maka na ọ dịka gọọmentị eji nwayọ esọ ha.
4. Ndị mba ofesi
Ọtụtụ mba ekwuola na oke ọgbugbu mmadụ na Naịjiria kachasị na Platu steeti na-emetụta ha.
Ndị mbụ bụ mba Amerịka ebe ụlọọrụ ha na Naịjiria depụtara ozi n'akwụkwọ nke Heather Nauert tinyere aka na ya.
Na-ekwu na "ogbugbu na mmebi ngwa ndị mmadụ na-eme na mpaghara etiti Naịjirịa bụ ihe na-eche anyị uche"
Ebe onye ozi mba Briten Paul Awkright ozi itiaka n'obi nyere Onyeisiala Naịjirịa Muhammadu Buhari.
Ihe o pụtara:
Ọ bụ n'ụbọchị Monday kaa onyeisi ndị uweojii nyere iwu na-ekwu si wepụ Kọmishona ndịuweojii na Plateau bụ Adie Undie n'ọkwa ya.
Anyị nụkwara na ka ọ dị ugbua, eweghchila ya n'ọrụ ya dịka kọmishona steeti ahụ.