Ogbaghara APC Imo: Aka Okorocha ọ dị na nsogbu ndị omeiwu?

Rochas Okorocha Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Okorocha achịịla Imo steetị agba abụọ

Ọnụ na-ekwụchitere Gọvanọ Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemedo agọọla akụkọ kwuru na aka Okorocha dị na ihe na-eme na ọlụ omeiwu nke Imo steeti nke mere ụfọdụ ndị omeiwu enyere ezumike ike ji bo ya ebubo na ọ bụ ya bụ osisi dachiri ha ụzọ.

Ebubo na-ekwu na nsogbu ndị omeiwu a ezumike ike a metụtara bụ ndị akwadoghị atụmatụ na ọgọ Okorocha bụ Uche Nwosu ga azọ oche gọvanọ Imo steeti na ntụlịaka 2019 na okpuru All Peoples Congress (APC).

Onwuemedo gwara BBC Igbo n'elu ekwenti na onweghị oge Okorocha maọbụ gọọmenti ya jiri tinye aka n'ihe na-eme na ụlọ omeiwu nke Imo steeti.

Onwuemeudo kwukwara na aka Okorocha siri ike n'ime ọchịchị APC na steeti ahụ na kwa na udo abataala n'otu patị ahụ n'ime Imo.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ebubo a niile bụ asị.

"Ndị a niile bụ ndị nwere ebumnobi ịbụ gọvanọ mana obi dị ha njọ maka na Okorocha akwadoghị ha."

O kwusiri ike na onweghị ntụlịaka imeụlọ ọzọ ga-eme na Imo steeti makana ndị Imo na-akwado ọgọ Okorocha.

Mana na mkparịtaụka BBC Igbo na onye bụbụ kọmịshiona mgbasa ọzị Imo steetị bụ Theodore Ekechi nwere, o kwuru na Okorocha na-achụ ndị mmadụ na-eleghị anya n'azụ.

Ekechi kwetakwara na a gaghị eme ntụlịaka imeụlọ ọzọ na steeti ahụ maka na ha eduola ndị isi ọrụ pati ha n'ọrụ.

Ekechi kwusiri ike na ọ bụ ihe ihere na Okorocha na ndị ọnụ okwu ya ka na-agọ njọ niile ha mere.

Onye ọzọ BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ bụ Mgbechi Onyedika bụbụ otuu n'ime ngalaba a kpọrọ 'Transitional Council of Ngor Okpala' na Bekee gwara BBC Igbo na Okorocha chụrụ ya maka na ya bụ onye ama ama dịka onye na-akwadoghị ọgọ ya nwoke.

Onyedika bọkwara ebubo na ha ka ji ya ụgwọ ọnwa ise.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a