Akụkọ kachasị n'abalị a: Amnesty International arụọla gọọmentị Naịjirịa aka ọjọọ

Akụkọ kachasị mkpa;

Otu Amnesty International ebola gọọmentị Naịjirịa ebubo

Image copyright Getty Images

Otu na-ahụ maka ugwu ruru onye bụ Amnesty International ebola gọọmenti Naịjirịa ebubo ịkwado ogbugbu ndị mmadụ bụ nke na-arị ibe ya elu ugbua na-ejideghị ndị ogbu mmadụ ahụ.

Otu a kwuru na ọnụ ọgụgụ ndị egburula n'afọ 2018 akarịala nke ndị nke e gburu n'afọ 2017.

Ndị mkpọrọ n'Enugwu abaala ụlọakwụkwọ mahadum

Image copyright Nigerian Prisons Service

Mmadụ iri atọ na asaa bụ ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ Enugu abaala ụlọakwụkwọ National Open Universịty nke Naịjirịa.

Onye nchịkọta ụlọakwụkwọ a n'Enugwu bụ ọkanmụta Uche Onyia gwara ndị a na ụlọọrụ na-ahụ maka Mahadum enyela ha ikike ịgụ akwụkwọ.

Agbagbuola onye ji aha pati Accord zọkwa Gọvanọ Akwa Ibom Steeti

Ndị oji egbe agbagbuola onye jibu aha Accord Parti zọọ ọkwa Gọvanọ n'Akwa Ibom Steeti bụ Okon Iyanam n'ụlọ oriri ọhụrụ ya dị n'Ogun Steeti ụnyaahụ.

Iyanam zọrọ ọkwa Gọvanọ Akwa Ibom Steeti n'afọ 2015 n'aha Pati Accord.

Egwuregwu:

Image copyright Getty Images

Mba Senegal esorola ogbo ha ndị mba Afrịka ndị ọzọ kwakọrọ pụọ n'asọmpi Iko Mbaụwa nke pụtara na onweghị mba Afrịka ọbụla fọrọ n'asọmpi a.

N'abalị a Jaapan ga-ezute Tunisịa ebe Ịngland ga-ezute Beljọm.

Nkeji nke abalị a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỤmụ m ndị na-enye m nri anọzịghị ndụ