Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Belgium na-eto Adnan Januzaj ugbua

Adnan Januzaj bụ onye bụ dike n'otu Belgium ugbua

Image copyright Getty Images

N'asọmpị iko mbaụwa, Adnan Januzaj bụ onye nyere Belgium mmeri n'ime mpị ha na Ingland sụrụ ụnyahụ.

Belgium ji otu ọkpụ na asataghị were merị ha mana, ha abụọ abaala agba nke anọ n'ime asọmpị a.

Ndị uweojii anwchela ndị otu Ipob abụọ

Ndị uweojii n'Enugwu ekwuola na ha nwụchiela mmadụ abụọ bụ ndị otu Ipob maka ebubo na aka ha dị na ogbunigwe atụru na bee onyeisi Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo.

Ndị ọzọ ndị uweojii nwuchiri bụ ụmụnwoke abụọ na-awakpo ndị gara n'ulọakụ na steeti ahụ ma zuru ego ha.

Ndị uweojii na ndị na-egbu anụ alusoola onweha ogụ

Image copyright Getty Images

Ndị na-egbu anụ kwuru na ọ bụ mmadụ ise nwụrụ n'ọgụ dara n'etiti ha na ndị uweojii n'ahịa Bodeja n'Ibadan isi obodo Oyo steeti ụnyaahu.

Akanaụba karịrị nde naira karị nde bụ ihe mebiri na mkpa mkpa a.

Mana onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ọ bụ mmadụ abụọ bụ ndị nwụrụ n'ọgu ahụ.

Image copyright Reuters

Na mba ofesi, otu nwoke aha ya bụ Jarrod Ramos bụ onye ndị uweojii na-ebo na o gburu mmadụ ise n'ulọ ndị ntaakụkọ Capital Gazzete dí na Maryland n'ime mba Amerịka.

Akụkọ kwuru na o mere ihe a n'ihi na ọ na-ewesa ụlọọrụ a iwe makana ha dere akụkọ na ọ okpasara otu nwaanyị agwa na-adịghị mma na Facebook.

Gee akụkọ anyị n'ụtụtụ a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỤmụ m ndị na-enye m nri anọzịghị ndụ