Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Aka anyị adịghị n'ogbunigwe ahu - Ipob
Ipob agọpụla onwe ha
Ebe foto si, Getty Images
Amabeghị ebe onye ndụ Ipob bụ Nnamdi Kanu nọ rụọ taa
Otu Ipob akwọpụla aka ha n'ogbunigwe ahụ a turu na be onyeisi Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo.
Odeakwụkwọ mmgbasa ozị ndị otu bụ Emma Powerful sị na ebubo a so na nkata ọjọọ a na-akpa iji mee ka uwa hụwa otu Ipob dịka ndị omeketereihepụụjo.
Cheta ndị uweojii kwuru na ha ji mmadụ abuo a na-eche na bụ ndị otu Ipob bu ndi a sị na ọ bu ha tụrụ ya bụ ogbunigwe
Ndị gọọvanọ akatọla mkpamkpa akpara na Jọs
Ebe foto si, Getty Images
Isi mmadụ ruru narị abụọ nara na Jọs
Otu jikọrọ ndị gọọvanọ na Naịjirịa agbakọla aka katọọ ogbugbu egburu ihe ruru mmadụ narị abụọ na okpuru ọchịchị Barkin Ladi na Riyom nke Jọs, Platu steeti.
Otu a, nke onyeisi ha bụ Abdul'aziz Yari nke Zamfara Steeti, kasiri ogbo ha nke Platu steeti bụ Simon Lalong obi ma kwe ya nkwa na ha ga-ahụ isi ihe a mere.
Ụmụaka kpafuru na mba Thailand
Ebe foto si, Facebook/Ekatol
US na Briten entinyele aka na-ịchọ ụmụaka ahụ na onye nkuzi ha
Tata bụ abalị itoolu ụmụaka iri na abụọ bụ ndị si otu egwuregwu bọọlụ Wild Boars Soccer Team na onye nkuzi ha funyuru anya n'ime mpio dị n'ime ugwu a Tailand.
Ndị ọrụ gbata gbata si mba ofesi na ndị nke Thailand na-agba mbọ ịchọta ụmụaka dị na agbata afọ iri na otu na iri na abụọ.
N'egwuruegwu Iko mbaụwa
France na Argentina ga achịpụ ya taa
Ebe foto si, Getty Images
Agantina na France abanyele agba nke abụọ tata
Tata n'egwuruegwu, ka France na Argentina ga achịpụ ya na elekere atọ nke ehihie a ebe
Uruguay na Portugal ga-hukwa isi ya mgbe ọkụrụ elekere asaa kpọmkwem.
Nke a pụtara na agba nke abụọ iko mbauwa akwụrụgo chim.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile
Lee ihe nkiri anyị
Onye eboro ebubo