Lionel Messi na Cristiano Ronaldo 'akwakọrọla pụọ' n'asọmpi Iko Mbaụwa
Akụkọ ndị dị mkpa n'ututu a
N'egwuregwu,
Messi na Ronaldo apụọla n'Iko Mbaụwa

Ebe foto si, EPA
A mabeghị ma Ronaldo ọ ga-enwe ohere ịgbara Pọtugal boolu n'ọdịnihu
N'egwuruegwu Lionel Messi na ogbo ya n'egwubọọlụ bụ Cristiano Ronaldo na ndị otu ha akwakọrọla ngwongwo ha pụọ n'asọmpi Iko Mbaụwa dịka Fransị gbara Argentina ọkpụ anọ asatara atọ.
Uruguay gbakwara Portugal ọkpụ abụọ asatara otu.
Sinetọ na-anọchite ọdịda anyanwu Imo steeti akatọọla bọgeti 2018

Ebe foto si, Benjamin Uwajumogu Facebookpage
Uwajumogu gwara ndị nta akụkọ na ụfọdụ n'ime ha ahụghị bọgeti tupu e binyeaka na ya.
Senatọ na-anọchite ọdịda anyanwu Imo steeti bụ Benjamin Uwajumogu, egosila iwe ya maka ọtụtụ ihe o kwuru ebechapụrụ na bọjeti nke 2018.
O kwuru na-ebechapụrụ ego edepụtara maka nhazi ọdọ ugbọelu dị na Akanu Ibiam nakwa ihe ndị ọzọ metụtara ndị Igbo.
Ụfọdụ ndị otu egwuregwu Nollywood akatọọla Gọvanọ Ambode

Ebe foto si, Getty Images
Gọvanọ Ambode gara na-ebe ihe mberede okporoụzọ a mere ụbọchị tọzde.
Ụfọdụ ndị egwuruegwu Nollywood ekwuola na achọghị nani ekpere na aka na-achị Legọsị steeti bụ Akinwunmi Ambode.
Ha kwuru na ihe ha chọrọ bụ ịkwusị ndị ọkwọ ụgbọala bu mmanu ụgbọala ịgba mgbe ndị mmadụ juputere n'ụzọ.
Ha sara Ambode asisa a ka o deputechara n'akara instagram ya etu obi si gbawa ya maka mberede okporo ụzọ lara ụgbọala iri ise na ano niyi ma gbuo mmadụ itoolu n'ụbochị tọzde gara aga.
N'akụkọ mba ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Ndị nchekwa kwụ chịm n'akụkụ ebe ndị a na-eme mbinyeaka na Mexico
A ga-ebido mbinye aka n'akwụkwọ ị chọta onye ga-anọ n'ọkwa onyeisiala, ndị omeiwu nakwa okpuru ọchịchị na mba Mexico .
Cheta na-enwere ezigbo mwakpo mgbe a na-akwado mbinyeaka a ga-eme taa.
Egbuola ihe ruru mmadụ otu nari na iri atọ kamgbe e bidoro ya bụ mwakpo.
Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri nke taa
Onye eboro ebubo