Ị chọrọ ịtụ votu na 2019? Lee ihe ga-eme

INEC Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo INEC na-ekwe nkwa na ha adịla nkwadobe maka ntuliaka 2019

Nnenna Okoronkwo bụ onyeisi ngalaba nhazi INEC, kwuru na ndị Naịjirịa asaala anya ugbua n'ihe gbasara ntuliaka karịa etu ọ dị na mbụ.

Ọ gwara BBC Igbo na ndị ụlọọru ha dị nkwadobe maka ịnabata ọtụtụ ndị Naịjirịa chọrọ ịnata PVC maka ịtụ votu na ntuliaka 2019.

Okoronkwo kwuru na oge ka dị maka ndị chọrọ idenye aha n'akwụkwọ maka ntuliaka a.

Gere ihe o kwuru maka isiokwu a n'uju ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption2019: Anya asaala ndị mmadụ, ha na-ekwote ịnata PVC - INEC

N'otu aka ahụ, ụfọdụ ndị otu pati ndọrọndọrọ ọchịchị ekwuputala uche ha gbasara ya bụ okwu.

Onye otu APC bụ Joe Igbokwe, kwuru na etu ndị Naijiria siri teta n'ụra dị mma makana ọ ga-enye aka ime ka ọtụtụ mmadụ binye aka n'akwụkwọ ntuliaka a.

O kwukwara na ọ bụrụ na ndị Naịjirịa chọrọ Buhari ha tunyere ya, mana ọ bụrụ na ha achọghị ya ha tunyere onye ha chọrọ.

Onye otu pati PDP bụ Ike Abonyi, kwuru na etu ndị mmadụ si sapee anya ha ugbua chọwa ịnweta PVC ha bụ ihe ọma.

O kwukwara na ọ bụ maka etu ndị otu pati ya si kpọkuo ndị mmadụ mere ha ji pụta n'igwe ịnweta PVC ha.

Ọ gwara BBC Igbo na ihe na-eme na Naịjirịa ugbua na-ata arụ, ya kpatara ndị mmadụ ji agba mbọ ihụ na ha ji votu ha wee wepụ ndị nọ n'ọchịchị ugbua.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: