PVC adịgboroja: Alibaba.com na-enyocha ndị na-ere PVC na nke ha

Ndị na-anata kaadị Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ha kwuru na akụrụngwa ọhụrụ ha tinyere ka ha chọrọ iji mee ntuliaka na-abịa n'Ekiti steeti

Ndị ụlọọrụ si China a na-akpọ Alibaba.com agwala BBC na ha na-eme nyocha banyere onye na-ere kaadị vootu Naịjirịa a na-akpọ PVC n'aha ịchafụ n'ahịa ha.

Onye kwuchitere ọnụ Alibaba.com bụ Maja Hauke gwara BBC na ha anaghị anabata onye ọbụla na-ere n'ọnụ ahịa ha n'ịntanetị nke dara iwu ha hibere.

Hauke kwuru na ha hụrụ na ihe ahụ a kpọsara mefidere iwu ire ahịa ha mere ha jiri wepụ ya ma na ha ga-aga n'ihu ime nyocha banyere aka ọrụ ndị omekome na-ada iwu ha.

Cheta na otu na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec bere nwịị na ndị ọjọọ na-eresi ụmụ Naịjirịa ajọ kaadị e ji atụ vootu n'igwe ịntanetị.

Onyeisi na-ahụ maka ikuzi gbasara vootu na Inec bụ oluwole Osaze Uzzi kwuru n'elu webụsaịtị ha na ha achọghị iji anya hụ ndị na-akpa agwa ọjọọ a.

O kwuru na ha tụkwara anya ụdị ihe a mere ha ji tinye akụrụngwa pụrụiche na kaadị vootu nke ha na-enye ga-eme na nke ndị adigboroja agaghị atụli vootu.

Uzzi kwuru na ụmụ akụrụngwa ndị ahụ na-ahụ na kaadị vootu nwere nchekwa tọrọ atọ nke ndị adịgboroja ahụ na-enweghi.

Lee ihe ị ga-eji mara kaadị adịgboroja

  1. Ị nataghị ya n'ụlọọrụ ndị Inec: Ndị Inec kwuru na ha anaghị eme mgbasaozi ire kaadị vootu n'ịntanetị, onye ọbụla si n'ịntanetị nye gị kaadị vootu abụghị nke ọma ya
  2. Ị kwụrụ ụgwọ ịnweta ya: Ndị Inec ekwuola na ha anaghịe ere kaadị vootu ere, naanị idebanya aha ebe ha na-eme ndebanye aha ka na-eme, onye ọbụla gwara gị weta ego maka kaadị vootu esighi n'aka ndị Inec. Gbakwa mbọ kpesaa ha n'aka ndị Inec
  3. Kaadị gị enweghi foto na ihe ndị ọzọ gosiri onye nwe ya: Onyeisi na Inec kwuru na ụfọdụ kaadị ndị na-atụ mgbere ya na-atọgbọrọ chakoo n'ihu, ọ naghị egosi foto na ihe ndị ọzọ na-egosi onye nwe ya. O kwuru na nke ahụ abụghị ezigbo kaadị
  4. Koodu: Ezi kaadị vootu na-ebu koodu ndị na-egosi na ọ bụ ezigbo ya. Koodu ndị a anaghị adịkwa na nke adịgboroja maọbụ ọ bụrụ nke a kọpịrị na kaadị ọzọ ka e tinyere na ya. Ụfọdụ koodu ndị bụ ndị anya na-ahụ nakwa ndị anya anaghị ahụ.
Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A na-ebinye aka iji nweta kaadị PVC ahụ

Agbanyeghi, Uzzi kwuru na ha na ndị ọrụ nchekwa ga-eme ọgbakọ gbasara ndịa hụ na-ere kaadị adịgboroja n'ịntanetị ịhụ n'aka kpara ha.

Na mgbakwụnye, otu ahụ na-elekwa anya iwejulite igwe e ji atụ vootu a na-akpọ "Card Reader" na Bekee iji chekwaa ha megide kaadị ndị na-abụghị ezi ya.

O kwuru na ha na-etinyekwu akụrụngwa ndị ọzọ n'igwe ahụ iji chekwaa ya site n'aka ndị adịgboroja ebe ha ga-ebido n'izu a iwejulite igwe ahụ na Naịjirịa niile.

BBC Igbo gbara onye na-ahụ maka nkuzi maka ntuliaka n'ụlọọrụ Inec na mpaghara ọwụwa anyanwụ bụ Ijeoma Igbokwe.

Nwaanyị Igbokwe kwuru na ndị uweojii nwere ike ibido nwụchiwe onye ọbụla ha hụrụ ji kaadị PVC adịgboroja.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNwaanyị na-ahụ maka nkuzi itu vootu na mpaghara ọwụwa anyanwụ

Ndị na-ere PVC a

Webusaịtị na-ere PVC adịgboroja a bụ Alibaba bụ webụsaịtị na-ere ọtụtụ ihe dị icheiche.

Otu ihe na-atụ n'anya bụ na webụsaịtị a si mba China ebe a na-emepụtakwa igwe 'Card Reader' Naịjirịa nakwa PVC ahụ na mba China, ọtụtụ a na-ajụ ma China a ga-awakpo ntuliaka Naịjirịa n'afọ 2019.

Mana nwaanyị Igbokwe kwuru na ndị ụlọọrụ ha na ndị uweojii na-eme nyocha agbanyeghi na ha ahụbeghi ihe ọbụla na-atụ aka n'ụdị ihe a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a