Inec: Lee etu ị ga-esi mara kaadị vootu adịgboroja

Inec: Lee etu ị ga-esi mara kaadị vootu adịgboroja

Otu na-ahụ maka ntuliaka bụ Inec ebela nwịị na ndị ọjọọ na-eresi ụmụ Naịjirịa ajọ kaadị e ji atụ vootu n'igwe ịntanetị.

Onyeisi na-ahụ maka ikuzi gbasara vootu na Inec bụ oluwole Osaze Uzzi kwuru n'elu webụsaịtị ha na ha achọghị iji anya hụ ndị na-akpa agwa ọjọọ a.

O kwuru na ha tụkwara anya ụdị ihe a mere ha ji tinye akụrụngwa pụrụiche na kaadị vootu nke ha na-enye ga-eme na nke ndị adigboroja agaghị atụli vootu.

•Inec akwadola ọnọdụ 119,973 maka ntuliaka 2019

•Inec: Nsogbu esorola ndebanye aha ntuliaka

•Wepụ onyeisi INEC - Ezeife na ndị ọzọ

Uzzi kwuru na ụmụ akụrụngwa ndị ahụ na-ahụ na kaadị vootu nwere nchekwa tọrọ atọ nke ndị adịgboroja ahụ na-enweghi.

Lee ihe ị ga-eji mara kaadị adịgboroja

1.Ị nataghị ya n'ụlọọrụ ndị Inec: Ndị Inec kwuru na ha anaghị eme mgbasaozi ire kaadị vootu n'ịntanetị, onye ọbụla si n'ịntanetị nye gị kaadị vootu abụghị nke ọma ya

2.Ị kwụrụ ụgwọ ịnweta ya: Ndị Inec ekwuola na ha anaghịe ere kaadị vootu ere, naanị idebanya aha ebe ha na-eme ndebanye aha ka na-eme, onye ọbụla gwara gị weta ego maka kaadị vootu esighi n'aka ndị Inec. Gbakwa mbọ kpesaa ha n'aka ndị Inec

3.Kaadị gị enweghi foto na ihe ndị ọzọ gosiri onye nwe ya: Onyeisi na Inec kwuru na ụfọdụ kaadị ndị na-atụ mgbere ya na-atọgbọrọ chakoo n'ihu, ọ naghị egosi foto na ihe ndị ọzọ na-egosi onye nwe ya. O kwuru na nke ahụ abụghị ezigbo kaadị

4.Koodu: Ezi kaadị vootu na-ebu koodu ndị na-egosi na ọ bụ ezigbo ya. Koodu ndị a anaghị adịkwa na nke adịgboroja maọbụ ọ bụrụ nke a kọpịrị na kaadị ọzọ ka e tinyere na ya. Ụfọdụ koodu ndị bụ ndị anya na-ahụ nakwa ndị anya anaghị ahụ.