Ihe mere tanka anyi ga na-agba ụzọ Lagos - NUPENG

Ụgbọala gbara ọkụ Image copyright LASEMA
Nkenke aha onyonyo Mmadụ itoolu nwụrụ na ihe mberede a

Onyeisi ngalaba na-achịkọta ndị ọrụ mmanụ ụgbọala nke Legos steeti akpọrọ Nigeria Union of Petroleum and Natural Gas Workers na Bekee bụ Tayo Abeyeji kwuru na ndị na-anya ụgbọala buru mmanụ ụgbọala agaghị akwụsị ịgba n'okporo ụzọ Legos makana onweghị ụzọ ọzọ ha ga-agba.

BBC Igbo gbara Abeyeji ajụjụ a maka akụkọ kwukwara na gọọmentị Legos ekewapụtala ụzọ ọhụrụ ga-abụ nke ndị ụgbọala buru mmanụ ga na-agba.

Abeyeji gwara onye ntaakụkọ anyị na ya maghị ihe ọbụla gbasara okporo ụzọ nke a.

N'ọnụ okwu Abeyeji, "Onyeọbụla na-ekwu maka okporo ụzọ ọhụrụ nke ha kewaputara, mana gọọmentị ekwughị ihe ọbụla cha cha maka ọkpụrụ ụzọ ọhụrụ a. Anyị ga na-agba okporo ụzọ anyị na-agba ugbua"

Image copyright Tayo Aboyeji
Nkenke aha onyonyo Abeyeji na-ebo ajọ okporo ụzọ maka ihe mberede na-eme ụgbọala buru mmanụ

Cheta n'ime izuuka garaaga, otu ụgbọala bu mmanụ ụgbọala gbawara n'akwa mmiri Otedola n'ime Legos steeti nakwa gbuo mmadụ itoolu.

Abeyeji kwusiri ike na ọbụghị eziokwu na ndị na-anya ụgbọala buru mmanụ bụ ndị na-achọ ọnwụ.

O kwuru na, "Onye bụ onye isi ya dị mma ga-achọ igbu onwe ya? Ihe mere na Otedola ajọgbuola onwe ya mana ọbụghị makana onye yara ụgbọala ahụ chọrọ igbu ndị mmadụ"

Ihe mmụta n'ọkụ mmanụ gbara na Legos

Abeyeji kwuru na ha na-agba mbọ ihụ na ụdị ihe a mere na Legos emeghị ọzọ.

O kwuru na, "Ugbua anyị na-achọ ị zụ ngwaọrụ ga na-enyocha ụgbọala anyị niile bu mmanu tupu ha agawa njem ọbula."

O kwukwara na oge ọbụla ka ndị otu ha na otu ''Federal Roads Safety Corps'' na-enye ndị na-anya ụgbọala bu mmanụ ọzụzụ di iche iche gbasara ụgbọala ha.

"Anyi na gọmenti anaghị ama aka mgba maka ihe a, ihe ọbụla ha chọrọ ka-anyị mee, anyị ga-eme", Abeyeji kwuru.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara