Gịnị ka ị ma gbasara atụmatụ 'State Police'?

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe Egbujo kwuru

Onye ọbụla na-ele anya n'ihe na-eme na Naịjirịa ugbua maara na otu ihe mmadụ niile kpụ n'ọnụ bụ ọgbaghara dị icheiche na-eme na mba a.

N'etiti Naịjirịa, ndị a na-enyo na ha bụ ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo na-akwata na Platu, Zamfara, Kaduna, nakwa Benue.

N'ọwụwa anyawụ, obodo abụọ dị n'oke-ala Ebonyi na Krọs Riva na-ebuso onwe ha agha, nke tarala isi ọtụtụ mmadụ.

Ka a na-akwado ntuliaka nke 2019, a na-eche na nsogbu ndị a ga-akarị akarị.

Ọ bụ maka ọgbaghara ndị a na ogbugbu mmadu na-eso ha ka osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa bụ Ike Ekeremadụ, bụ ihe dị ya n'obi o ji na-akwado iwepụta iwu ga-ahu na-emegharịrị ọnọdụ ndi uweojii na Naịjirịa.

Ekweremadu sị na etu ngalaba uweojii dị ugbua adabaghị, "ọkachasị ụdịrị a chọrọ n'ụdịrị obodo anyị".

N'okwu ya maka ogbugbu mmadụ na arụ ndị ọzọ na-eme na Naịjirịa, Ekweremadu sị na ọ bụ makana steeti dị icheiche enweghị ike iziga ndị uweojii ozi etu ha si chọ, ọkachasị mgbe ọghaghara dị.

Ọ sị na ndị na-achị steeti dị icheiche kwesiri inwe ikike iwe ndị mmadụ n'ọrụ uweojii, zụọ ma nye ha nkwado ha ga-eji mee ọrụ nchekwa obodo.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnye kọmishọna uweojii nọ ezumike nka kọwapụtara uche ya gbasara uweojii steeti

Ekweremadu sị na ikike Naịjirịa adịghị ka nke Amerịka, ebe obodo ọbụla nwere ikike ihiwe uweojii nke ha.

Onye ọnụ ya na-eru n'okwu banyere ihe na-eme na Naịjirịa bụ Ugo Egbujo -- bụkwa onye ọkaiwu na dọkinta -- gwara BBC Igbo na atụmatụ a ziri ezi, mana a ga-etinye ya anya.

Ọ sị na ọ bụrụ ebe udo dị, ebe onye ọbụla na-asọpụrụ iwu, "ọ ga-aka mma ka steetị niile nwe ndị uweojii nke ha."

Egbujo sị na ọ bụrụ na e si etu a nwee uweojii ma na "Local Government", ndị uweojii ga-ama onye bi ebe obi.

Atụmatụ dị icheiche apụtala maka etu Naịjirịa ga-esi mee uweojii nke steeti ma ọ bụrụ na mba a chọrọ iso usoro ahụ.

Ụfọdụ na-ekwu na ọ ga-adị ka nke ndị mba Amerịka, ebe e nwere uweojii nke gọọmentị etiti, ma nwee nke steeti na nke gọọmentị okpuru ọchịchị.

Egbujo kwuru na n'agbanyeghị na e nwebụrụ uweojii nke steeti na mbụ, ọ dara maka ndị mmadụ jiri ihe Bekee na-akpọ "tribalism" mebie ya.

BBC Igbo gbalịrị inweta uche ndị uweojii maọbụ ndị gọọmentị etiti maka atụmatụ a, mana ha asaghị ekwentị ha.

Egbujo gara n'ihu kọwaa ihe uweojii nke steeti pụtara.

Ihe bụ uweojii steeti

Image copyright AFP

1: Uweojii steeti bụ atụmatụ ga-enye ndị gọvanọ steeti ikike ịbụrụ ndị ga-ezi ndi uweojii ozi

2: Ndị chọro ya sị na ọ bụ atụmatụ ikike Naịjirịa kwadoro maka na mba a bụ ihe ndị Bekee kpọrọ "Federation"

3: Nke a pụtara na steeti dị iche iche nwere ike iwe ndị mmadụ n'ọrụ uweojii, ma kwụọ ha ụgwọ

4: Ndị steeti ga-enwekwa ike hazie ụdịrị uwe ndị uweojii ha ga-eyi na ihe ndị ọzọ

5: Ndị uweojii nke gọọmentị etiti ka ga-adịkwa, ma nwee ikike karịrị nke ndị steeti

Gee ihe Egbujo kwuru n'uju n'elu.

Isiokwu Ndị Emetụtara