Ndị uweojii emeghị ngagharị iwe ọbụla - Jimoh Moshood

police

Ebe foto si, Getty Images

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Naịjirịa bụ Jimoh Moshood ekwuola na ndị uweojii emeghị ngagharị iwe taa dịka akụkọ si kwuo.

N'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Jimoh Moshood depụtara, o kwuru na "enweghị onye uweojii mere ngagharị iwe na Maiduguri maka ihe gbasara ụgwọ e kwesịrị ịkwụ ha maka ọrụ pụrụ iche ha rụrụ."

Kama dịka Moshood si kwuo, ụfọdụ ndị uweojii so n'otu na-arụ ọrụ pụrụ iche gara n'isi ụlọọrụ ha na Borno n'isi ụtụtụ taa, ịjụ ihe ji nkịta ọnwụ gbasara ụgwọ e kwesịrị ịkwụ ha.

Moshood kwukwara na "ndị uweojii steeti ahụ nọ n'ebe ha na-arụ ọrụ na-ahụ na udo dị na gburugburu steeti ahụ."

Akụkọ si Maiduguri kwuburu na ndị uweojii Naịjirịa mere ngaghari iwe n'isi ụlọọrụ ha na steeti ahụ tata.

Ebe ụfọdụ ndị bi n'obodo ahụ gwara ndị ntaakụko BBC na ndị uweojii nọchịrị ụzọ si Mahadụm Ramat gawa Maiduguri n'isi ụtụtụ taa.

"Mgbe ha bidoro ngagharị iwe ha, ha gbaliri egbe elu," otu onye bi obodo ahụ kwuru.

Akụkọ kwuru na ndị uweojii mere ngagharị iwe a makana a kwụghị ha ụfọdụ ugwọ e kwesiri ikwụ ha maka ọrụ ha rụrụ n'etiti agha a na-ebuso Boko Haram nke bekee kpọrọ 'special duty allowance'.

Akụkọ si n'ụlọ ntaakụkọ ndị ọzọ kwuru na onyeisi ndị uweojii na Borno steeti kwuru na ya amaghị maka ihe a mere e ji enye nsogbu, ma na ya na-achọ ịchọpụta isi na ọdụ ya.

Ọ bụghi mgbe niile ka a na-ahụ ụdịrị ngagharị iwe a n'etiti ndị uweojii Naịjiria.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: