Uweojii steeti bú ezigbo ihe - Ugo Egbujo
Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Ka enwee uweojii steeti na nke gọọmentị etiti - Ugo Egbujo

Egbujo sị na ọ bụrụ na e si etu a nwee uweojii ma na "Local Government", ndị uweojii ga-ama onye bi ebe o bi.

Atụmatụ dị icheiche apụtala maka etu Naịjirịa ga-esi mee uweojii nke steeti ma ọ bụrụ na mba a chọrọ iso usoro ahụ.

Ụfọdụ na-ekwu na ọ ga-adị ka nke ndị mba Amerịka, ebe e nwere uweojii nke gọọmentị etiti, ma nwee nke steeti na nke gọọmentị okpuru ọchịchị.

Egbujo kwuru na n'agbanyeghị na e nwebụrụ uweojii nke steeti na mbụ, ọ dara maka ndị mmadụ jiri ihe Bekee na-akpọ "tribalism" mebie ya.