Akụkọ kachasị n'abalịa a: Yakubu Gowon eweela iwe maka ogbugbu mmadụ
Yakubu Gowon agbarụọla ihu kpọọ oku ka akwụsị oke ogbugbu na Naịjirịa
Aka chịbụrụ Naịjirịa mbụ bụ Yakubu Gowon akpọkuola Onyeisiala Buhari ka ọgbalịa jide, kpe ha ikpe ma taa ha ahụhụ bụ ndị niile aka ha dị n'ịwụfụ ọbara n'obodo dị iche iche na Naịjirịa.
Gowon kwuru nke a na ọgbakọ ndị ọdịda anyanwu nke ugwu Naịjirịa mere na Katsina steeti.
Ndị uweojii sị na ndị otu ha agbaghị abụbụ ọrụ ọbụla.
Ndị ụweojii ekwuola na onweghị abụbụ ọrụ ndị otu ha gbara na Maiduguri dika kepukepu anụrụ sị akọ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Jimoh O. Moshood kwuru na ndị otu ha ahụ bịara ịmata ihe ji nkita ọnwụ gbasara ụgwọ eji ha. Mana ụfọdụ ndị bi ebe ahụ gwara BBC na ihe a mere eme
Otu nwaanyị eche na-ọnwọla etetela na Saụt Afrika
Na mba Saụt Afrika, otu nwaanyị eche na ọnwụọla ekuliela na Mọchụarị dị na Gauteng province.
Ndị ụlọọrụ ụlọọgwụ ebe nwaanyị ahụ nọ sị na ya bụ nwaanyị na-anata ọgwụgwọ ugbua.
N'egwuruegwu Iko mbaụwa
Mekziko akwarala lii ebe Brazil na aga n'ihu
N'egwuruegwu, Brazil agbalara Meziko ụgbọ nwamkpi n'Iko Mbaụwa tata mgbe ha jiri ọkpụ abụọ duo ha ụlọ.
Belgium na Japan ga achịpụ ya na mgbede a mgbe ọkụrụ elekere asaa kpọmkwem.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Lee ihe nkiri anyị