Ihe ụlọikpe ji nye iwu ka e bido usoro ịchụda Buhari

Muhammadu Buhari Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onyeisiala Muhammadu Buhari enweghị ndị kwusiri ike na-agbagha okwu ọchịchị ya

Ụlọikpe ukwu dị n'Osogbo enyela ụlọomeiwu ohere ibido usoro ịchụda Muhammadụ Buhari n'ọkwa dịka onyeisiala Naijiria ozigbo.

Jọstis Maurine Adaobi Onyetenu nyere iwu n'akwụkwọ nke ụmụafọ Naijiria abụọ, Kanmi Ajibola, onye ọkaiwu na Sulaiman Adeniyi, onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye gbara sị ka ụlọikpe nye ụlọomeiwu iwu ka ha chụda onyeisiala Buhari.

Mmadụ abụọ degara ụlọomeiwu nke ukwu(Senate) na nke nta(House of representatives) akwụkwọ mkpa ọ dị ka ha chụda onyeisiala n'ihi he ha kpọrọ imejọ iwu naijiria ma kwuo na ọ bụrụ na ha emeghị nke na ha ga-agba ha akwụkwu n'ụlọikpe.

Mana ndị omeiwu emeghị ihe ha rịrọrọ nke mere ka ha ga uwa ụlọikpe ga-agba akwụkwọ riọ ka ụlọikpe nye sineti na ụlọomeiwu, ibido usoro ịchụda ya n'ọkwa.

Na mkparịtaụka BBC na onyeọkaiwu Ajibola nwere n'ekwentị, o kwuru na mkpebi ahụ gbadoro ụkwụ na oke ogbugbu mmadụ na-aga na Naijiria nke Buhari akwụsịnwughị, egeghị mkpebi ụlọikpe na mmejọ ndị ọzọ onyeisiala mejọrọ iwuala Naijiria.

"Ụlọikpe mere mụ arịrịọ m nke bụ inye ụlọomeiwu (NASS) iwu ka ha bido usoro ịchụtu Onyeisiala Muhammadu Buhari n'ọkwa.

"Nke gbadoro ụkwụ na Buhari akwụsinwughị oke ogbugbu mmadụ nke naaga n'ihu na mpaghara Naijiria dị iche iche., erubeghi isi na mkpebi ụlọikpe and mmerụ dị iche iche o merụrụ iwu ala anyị."

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ụlọomeiwu niile ga-aga mkpọrọ ma ọ bụrụ na ha nupu isi n'iwu ụloikpe nyere.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a