Nchụda Buhari: Lee usoro isii ụlọomeiwu ga-eso

Nnọkọ ụlọomeiwu ukwu na nta Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nnọkọ ụlọomeiwu ukwu na nta dị mkpa n'ịgbaso usoro ịchụda onyeisiala

N'ụbọchị Wenezde abalị 4 ọnwa Julai, ụlọikpe ukwu dị n'Oshogbo nyere ụlọomeiwu iwu ibido usoro ịchụda Muhammaduụ Buhari n'ọkwa dịka onyeisiala Naijiria ozigbo.

Ebe ụfọdụ ndị ọkaiwu dịka Chijioke Ike na-ekwu n'iwu ahụ ụlọikpe ahụ nyere bụ ihe ziri ezi n'ihi ihe ha chere bụ na onyeisiala emetala ihe zuru ka a chụda ya, ebe ụfọdụ dịka Godstime Okafor na-ekwu na mbọ ahụ agaghị amịta mkpụrụ n'ihi na "mkpi mbugota anaghị agba, n'ihi na n'onwe ha ndị omeiwu achọghị ịchụda onyeisiala."

Na mkparịtaụka ha na BBC nwere n'ekwentị, ọkaiwu abụọ a bụ Okafor na Ike kọwara na ọ bụrụ na onyeisiala metara ihe gafere ikike iwu Naijiria nyere ya, usoro e kwesiri igbaso dịka ọ dị n'iwu Naijiria iji iwepụ ya n'ọchịchị.

Lee usoro ndị ahụ :

1. Ha ga-edepta ya

Ndị ụlọomeiwu ga-edepụta ihe ndị onyeisiala mere o jiri mejọọ iwu nke, Ọkaiwu kpọrọ 'Catalogue of Impeachable offence' na bekee

2. Ha ga-edegara ọkaiwu ukwu Naijria(Chief Justice of the Federation) akwụkwọ

Ọkaiwu Okafor kọwara, "Ọ bụrụ na abụọ n'ime ụzọ atọ ndị ụlọomeiwu binye aka n'akwụkwọ ndepụta ihe ọjọọ onyeisiala mere megide iwu, ha ga-ezigara onye ọkaiwu ala anyị ozi ahụ

3. Onyeọkaiwu ukwu ahụ ga-ehibe kọmitii

Ọ bụrụ na onye ọkaiwu kachasị nata ozi ndị ụlọomeiwu, ọ ga-ehibe kọmitii ga-eleba anya iji mara ma onyeisiala o mere ihe ndị e boro ya n'ebubo

4. Kọmitii ga-enyocha ebubo ndị a

Kọmitii ahụ ga-enyocha ebubo ndị ahụ ma wepụta mpụtara nyocha ha n'ime abalị asaa.

Ọkaiwu Ike kọwara na, 'Tupu nke a emee, kọmitii ahụ ga-akpọ onyeisiala oku ịzara ọnụ ya.

5. Kọmitii ga-ezighachi ọkaiwu kachasị mpụtara nyocha ha

Ọ bụrụ na kọmitii enweghị ihe ha chọpụtara, okwu ahụ ga-ebe, usoro nchụda agaghị enwekwa isi, ị mara na a ga-ekpofu okwu ahụ n'ọhịa

6. Nchụda onyeisiala e biri ọkụ

Ma ọ bụrụ na mpụtara nyocha kwuru na onyeisiala mere ya, ị mara na atụmatụ ahụ ga-enwe isi

Ihe na-eso ya bụ nnọkọ ụlọomeiwu ukwu na ụlọomeiwu nke nta

Ọkaiwu Ike kwuru na "ebe a ka ha ga-anọ gụpụta mpụtara nyocha kọmitii. Ọ bụrụ na nchọpụta ha kwuru na onyeisiala mere ihe ahụ, mgbe ahụ ha a chụọ ya n'ọrụ."

Akụkọ ga-amasị gị: