Saraki: Ụlọikpe kachasị agọọlara m ọnụ

Bukola Saraki Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Bukola Saraki bụbu Gọvanọ Kwara steeti tupu ọ banye ụlọomeiwu

Bukola Saraki bụ onyeisi ụlọomeiwu ukwu Naijiria kwuru na mkpebi Ụlọikpe mere n'ụbọchị Fraide, abalị isi nke ọnwa Julai, afọ 2018 bụ ịgọtara ya ọnụ ya.

Saraki onye kwupụtara nke a n'igwe okwu Twitter, kwuru na 'Obi dị m ụtọ' na mkpebi ụlọikpe kachasị nke kwuru na ikpe ahụ kpụgharịrị ya ụbọchị 1018 bụ aka ọrụ ndị obi adịghị mma na ya ghọrọ onyeisi ụlọomeiwu ukwu.

Na mkpebi ya, ụlọikpe kachasị kwuru n'aka Saraki dị ọcha n'ebubo na ọ ghara ụgha banyere nkwupụta ihe o nwere, bụ ikpe dị na ụlọikpe pụrụ iche na-ahụ maka agwa ndị n'ọkwa ọchịchị nke a kpọrọ 'Code of Conduct Tribunal( CCT) na bekee.

Ụlọikpe kachasị nke ọkaikpe Cletus Nweze kwudoro na mkpebi nke ụlọikpe mkpegharị mere ma tọpụ ya n'ebubo atọ ndị ọzọ.

CCT nke onye ndu ha bụ Danladi Umar kagburu ikpe Saraki n'ihi na ndị akaebe na ihe akabe e wetara gbadoro ụkwụ na kepukepu, na abụghị okwu ahụrụ anya.

Mana n'akwụkwọ nke gọọmentị etiti gbagharịrị, ụlọikpe mkpegharị nọ n'Abuja n'ọnwa Disemba afọ 2017 wegahchiri ebubo atọ n'ime iri na asatọ(18 counts) nke CCT kụpụburu.

Mana na mkpebi ya, Nweze kụpụrụ akwụkwọ nke gọventi etiti gbagharịrị.

Nweze kwụrụ na ihe CCT kpebiri nke kwuru na ebubo niile ahụ gbadoro ụkwụ n'asịrị, na ndị butere ikpe akpọghị ndị nwere ihe akaebe doro anya ka ha gbaa akaebe.'

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a