Ifeanyi Ugwuanyi emeriela n'ụlọikpe

Enugwu Steeti na Ndọrọndọrọ ọchịchị Image copyright Enugu state/Fb
Nkenke aha onyonyo Ifeanyi Ugwuanyi bụ Gọvanọ Enugwu steeti

Ozi n'eru BBC ntị na ehihie a kwuru na Gọvanọ Ugwuanyị nke Enugwu Steeti emeriela Sịnetọ Ayogu Eze nke zọbụrụ ọkwa Gọvanọ nke steeti ahụ n'ụlọikpe kachasị.

Onye ode akwụkwọ ụkwụ nke steeti ahụ Festus Uzor gwara BBC nke a mgbe anyị kpọrọ ya n'ekwenti tata.

Ka ọ dị ugbua ndị ọnụ n'eru na-okwu n'ala Igbo bidolari ikele Gọvanọ Ugwuanyi.

Osote onyeisi nke ụlọomeiwu ukwu dị n'Abụja bụ Ike Ekweremadụ kwuru na ya bụ mmeri abụghị nke Ugwuanyi sọsọ mana ọ bụ " mmeri udo, ike oke nhatanha na mmepe obodo nke Engugwu steeti".

Ekweremadu kwuru na "mmeri a ga-agba Gọvanọ Ugwuanyi ume ma mee ka omee karịa ka ọ meburu na mbụ" ma nyekwa ya ike maka ịzọgharị ọchịchị nke afọ 2019.

Cheta na Gọvanọ Ugwuanyi na Ayaogu Eze na agbarita mgba n'ụlọike kemgbe ha mechere ndọrọndọrọ nke imeụnọ PDP n' Enugwu nke họpụtara Ugwuanyi.

Ayogu gbara akwọkwụ n'ụlọikpe n'arịọ ka ụlọikpe nyere ya aka kagbuo nhọpụta PDP họpụtara Ugwuanyi maka ịzọ ọkwa Gọvanọ Steeti ahụ maka na usoro esiri họpụta ya ezighị ezi.

Mana ụlọikpe mbu ma nke abụọ wezụgara ya bụ arịrọ Ayogu rịọrọ maka na ha sị na ọkpa esịghị ya bụ arịrịọ ike n'ala.

Ụgbụa ụlọikpe ụkwu akwadola mkpebi nke mbụ na nke abụọ nke wetere ya bụ isi okwu na njedebe.

Akụkọ dị mkpa n'ịchafụ : Kpochapụ ndị nchekwa juru n'ụzọ ọwụwanyanụ Naịjirịa - Sineti

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a