Akụkọ kachasị n'abalịa a: Yul Edochie abụlụra ojeozi pụruiche n'Anambra steeti

6 Julaị 1967 bụ ụbọchị agha Biafra bidoro

Nkọwa foto,

Emeka Odumegwu Ojukwu bụ onyendụ ndị Biafra

Tata bụ Julai 6, afọ iri ise gara aga ka-egbe mbụ bidoro ịda na Biafra na Gakem nke Kros River steeti.

Chris:Ihe dị otu a abịakwalara Igbo ọzọ.

Gọvanọ Ugwuanyi meriri ikpe ya na Ayogu

Nkọwa foto,

Ifeanyi Ugwuanyi bụ Gọvanọ Enugwu steeti

Gọvanọ Ugwuanyị nke Enugwu Steeti emeriela Sinetọ Ayogu Eze n'ụlọikpe kachasị, n'akwụkwọ ọ gbara ka a kagbuo nhọpụta PDP họpụtara Ugwuanyi ịzọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ na 2015.

Bukọla Saraki emeriela Ikpe ya ndị CCT

Nkọwa foto,

Bukola Saraki bụ onyeisi ụlọomeiwu kachasi na Naịjirịa

N'otu aka ahụ, ụlọikpe kachasị kagburu mkpebi ụlọikpe mkpegharị n'ebubo na onyeisi Sineti bụ Bukola Saraki ghara ụgha n'ikwupụta akụ ya.

Yul Edochie abụlụra ojeozi ukwu pụruiche n'Anambra steeti

Nkọwa foto,

Yul Edochie chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa

N'aka nke ọzọ, Yul Edochie akwọla aka iso okenye riwe ihe dị ka Gọvanọ Willie Obialo si họpụta ya ka ojeozi ukwu pụruiche nke steeti ahụ.

N'egwuruegwu Iko mbaụwa

Fransi a taala isi Urogua 2- 0

Nkọwa foto,

Frans abaala agba nke anọ na Iko Mbaụwa

N'egwuruegwu Fransi ji ọkpụ abụọ dula Urugua na asọmpị iko mba ụwa.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ,

BBC Nkeji

Lee ihe nkiri anyị

Aha onyonyo,

Illbliss maka Biafra.