Akụkọ kachasị n'ụtutu a: CAN akagbuola ngagharị iwe ha hibere

Akụkọ ndị dị mkpa n'ututu a

Dino Melaye 'etiela egwu'

Sinetọ Dino Melaye emeela ihe e ji kpụrụ ya n'ọnụ ọzọ.

Dino Melaye etiela egwu ọzọ ebe ọ jara otu pati PDP mma na-asị na ọ chọrọ ịlaghachị, ma kwuo na APC ataala ya ahụhụ.

CAN na NSCIA etinyela ọnụ n'okwu ogbugbu ndị mmadụ

Ndị otu CAN na-eme ngagharị iwe

Ebe foto si, Getty Images

Ngalaba a kpọrọ Nigerian Supreme Council of islamic affairs agwala gọọmentị etiti ka ha gbaa mbọ hụ na nchekwa ruru ime obodo, maka ogbugbu mmadụ na-eme na Naịjirịa, ma na-akatọ okwu dị iche iche ndị ụkọchukwu na-ekwu maka ya.

Nke a na-eme ka ndị otu Christian Association of Nigeria kagburu ngagharị iwe ha chọburu ime n'ụbọchi iri na otu nke ọnwa a gbasara oke ogbugbu na Naịjirịa. Ha sị na ọ ga-adịba ruo mgbe a mara ọkwa ọzọ.

Onyeisi ha bụ Samson Olasupo Ayokunle, kwuputere nke a ụnyaahụ n'akwụkwọ ndepụta, ebe o kwukwara na ha ga-eme ekpere na ibuọnụ ụbọchị atọ n'ụlọụka niile dị na Naịjirịa nakwa ngalaba CAN niile dị na steeti niile, nke ga-ebido n'ụbọchị Julaị 9 ruo Julaị 11.

N'akụkọ mba ofesi

Ndị agha Kemịkal metụtara

Ebe foto si, Reuters

Ngalaba na-elebanye anya na kemịkal e ji eme ngwaagha a kpọrọ "Organization for the Prohibition of Chemical Weapons" na Bekee, e kwuola na ọ bụ klorine ka ndị omekome jiri wakpoo ma gbuo ọtụtụ ndị mmadụ n'obodo Douma dị na Syria n'ọnwa Epreelụ.

Ịji cheta ka ihe a si mee n'ọnwa Epreelụ, gụọ ya ebe a Ọgụ Sirịa: Ngwaagha kemịkal egbuola ọtụtụ ndị mmadụ

N'egwuregwu,

N'egwuregwu, ka a gbapụrụ Brazil n'asọmpi Iko Mbaụwa ụnyaahụ, onye nchịkọta ha bụ Tite, ekwuola na ha pụrụ maka na Belgium bụ ndị ha zutere, gbakarịrị ha.

Ndị na-akwado Ịngland

Ebe foto si, Getty Images

N'otu aka ahụ, cheta na Ingland na Swiden ga-ezute ibe, ebe Rọshịa na Kroeshia ga-asọ mpi ịmata ndị ga-agafe agba ọkara Ikpeazụ.

Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa

Aha onyonyo,

Illbliss maka Biafra.