Ipob: Nna na nwa ekpeela udo

Aha onyonyo,

Ihe Rev Peace Gwara BBC

Ụkọchukwu Peace, bụ otu n'ime ọnụ na-ekwuchitere otu Ipob kwuru na ha na otu na-achikọta Igbo niile bụ Ohaneze Ndịgbo nọ n'ọnọdụ onye tinye mma ya n'ọbọ.

Peace kwuru nke a mgbe BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ ka akụkọ pụtara na ụdiri kepukepu nọ n'ikuku.

O kwuru na nke bụ eziokwu bụ na ha na Ohaneze ka nọ n'ụzọ ịchọ udo, nke mere ha jiri nye Ohaneze izuụka abụọ ka ha were leba anya n'ihe niile na-esere ha okwu ma kpanye agwa ha n'ebe Ipob nọ.

Ọ sị na ọ bụ maka ọnọdụ a ka ha ji gwa ndị Ipob niile ka ha kwụsị ibuso Ohaneze agha.

Ọnọdụ a ga-anọ ruo izuụka abuọ, ọ bụrụ na ihe dị iche adịghị "anyị ga-ama ihe anyị ga-eme".

Gee olu Peace n'elu.

Ihe Ohaneze kwuru

BBC Igbo gbakwara mbọ inweta ndị Ọhaneze ka ha kwuo nke mere.

Otu onye gbagotere na ya bụ otu, na-achọghị ka anyị kwuo aha ya, gwara BBC Igbo na e nwere eziokwu dị na ya bụ okwu.

Cheta na ndị uweojii na-ekwu na ndị tụrụ ogbunigwe na be onyeisi Ohaneze ndị Igbo bụ Nnia Nwodo bụ ndị a na-eche na ha bụ ndị Ipob.

Ipob gọrọla aka na ụkwụ maka nke a, ma kwuo na ndị uweojii chọrọ inye ha ajọ aha.

Nnia Nwodo bụ onyeisi Ohaneze kwụkwara na ya echeghị na aka ndị Ipob nọ na ya bụ ogbunigwe a tụrụ na be ya.

Ohaneze na-ekwukarị na Ipob bụ nwa ha, mana Ipob na-akọwa na okwu nhazigharị Naịjirịa n'ụdị Bekee na-akpọ "Restructuring" Ohaneze chọrọ adabaghị n'ihe ha chọrọ bụ nkewa.

Ha hụrụ echiche Ohaneze ka mmegharị anya.

Lee etu otu onye na ndị ahụ uweojii kpara aka si zara ọnụ ya n'ihe nkiri a.

Aha onyonyo,

Onye eboro ebubo