Ndị Igbo kwenyere n'ụkpụrụ 'nye anyị nke ruru anyị' - Onye ndụmọdụ Ekweremadu

Ike Ekweremadu Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ekweremadu anọọla ụlọomeiwu Naịjirịa afọ 11, nke mere ka ọ bụrụ onye omeiwu kachasị nọrọ ogologo oge n'ụlọ ọrụ ahụ

Nke a bụ mbụ a na-ehibe ọgbakọ 'International Parliament for tolerance and peace (IPTP)' iji wee kwado mmekọrịta na mkparitaụka gbasara ọdimma nakwa nsogbu na-esogbu akụkụ mbaụwa dị iche iche.

Ọgbakọ a nke e mere n'izu ụka mbụ n'ọnwa Julaị n'obodo Malta họpụtara Taullant Balla nke si ụlọomeiwu Albania dịka onyeisi mbu, ebe osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa bụ Ike Ekweremadu bụ onyeisi kọmiti na-ahụ maka imepụta iwu na ya.

Onyeisi ọgbakọ ukwu a mutara ọgbakọ nke nta (IPTP) a bụ Ahmed bin Mohammed Al-Jarwan, kwuru na dịka mbaụwa niile na-agabiga mkpasuiwe, esemokwu dị n'okpukpere, iyi egwu, ịhọ otu, oke ogbubgu nakwa ndị ọzọ, ọgbakọ a ga-enye aka iweta udo.

Al-jarwan kwuru na ọ bụghịzị sọsọ na mpaghara ndị omeiwu na-anochite ka ha ga na-anwa oke ha, na ha kwesiri ịgbasapụ aka udo nye mbaụwa niile.

Ihe ọkwa Ekweremadu pụtaara Obodo Naịjirịa

Onye ndụmọdụ n'ụlọọrụ Ike Ekweremadu bụ Uche Anichukwu gwara BBC Igbo na ọnọdụ ọhụrụ a bụ nnukwu ihe meere ndị Naịjiria nakwa ndị Igbo.

O kwuru na e ji iweta udo mara Ekweremadu mgbe ọ chịburu n'ụlọomeiwu nke 'Economic Community of West African States (Ecowas)'.

Anichukwu kwuru na Ekweremadu na ndị omeiwu ndị ọzọ si n'akụkụ mbaụwa niile n'ọgbakọ a ga na-atụgharị uche ma mepụta iwu dị iche iche ga-enyeaka iwebata udo na mbaụwa.

Gere ihe o kwuru n'uju ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEtinyela udo Naịjirịa n'aka Ekeremadu ọzọ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara