Kemi Adeosun: Ihe NYSC kwuru maka asambodo

Kemi Adeosun Image copyright Kemi Adeosun Facebook
Nkenke aha onyonyo Adeosun bubu kọmishọna na-ahụ maka ego na Ogun steeti

Ụlọọrụ na-ahụ maka ife ala nna akpọrọ NYSC n'ịchafu amanyela ọnụ n'okwu gbasara mmerụaka dị n'asambodo minista na-ahụ maka akụ na ụba na Naịjirịa bụ Kemi Adeosun.

N'akwụkwọ onye na-ekwuchitere ha ọnụ bụ Adeyemi Adenike depụtara n'ụbọchị Julai 9, ha kwetere na Adeosun debara aha n'akwụkwọ iwezuga onwe i sonye n'emume ife ala nna.

Ha kwukwara na ha ga-elebanya na ya bụ asambodo aghụghọ.

N'ọnụ ha "anyị a nụla maka ihe gbasara asambodo aghughọ ekwuru na Adeosun jiri nweta ọkwa ya. Mgbe anyi lebara anya n'akwụkwọ anyị, anyị chọpụtara na o denyere aha maka i nweta asambodo nwezuga.''

Cheta na ndị ntaakụkọ ''Premium Times'' deputara akụkọ na-agaharịnụ na Adeosun emeghị emume ife ala nna ma nwetakwa asambodo nwezuga aghụghọ.

Emume ife ala nna a bụ nke onye ọ bụla gụchara Mahadum na-erubeghị afọ iri na atọ ga-emeriri.

Ruo ugbua Adeosun ekwubeghị ihe ọ bụla gbasara ya bụ ebubo.

Adeosun achịala dịka kọmishọna na-ahụ maka ego na Ogun steeti site n'afọ 2011 ruo 2015 mgbe Ibikunle Amosun na-achi dika gọvanọ.

O mechara soro ọchịchị Muhammdu Buhari dika Minista na-ahụ maka akụ na ụba n'afọ 2015.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara