United Nations: Azụ ga-agwu na mmiri

Ebe foto si, Getty Images
Azụ bụkarị nrị na-edozi ahụ ọtụtụ mmadụ nọ n'akụkụ ụwa dị iche iche
N'akwụkwọ United Nations depụtara n'ụbochị Julaị 9, ha dọrọ ụwa aka na ntị gbasara ụkọ azụ na-abịa n'ihu.
UN kwuru na ụkọ azụ ga-adị makana ọtụtụ mmadụ na-akụgbu azụ n'osimiri dị iche iche n'obodo ha nke kpatara na ya bụ azu ha jiri mere ihe ndozi ahụ agaghị erutenwukwa ha aka n'ọdịnihu.
Otu a kpọrọ ''Food and Agriculture Organisation'' (FAO) kwuru na nkụgbu azụ a na-emekarỊ n'obodo ka na-emepe emepe ebe ndị mmadụ na-agba mbọ inweta ezigbo nri na-edozi ahụ.
O kwukwara na ịkụ azụ ga-eji ihe ruru pasentị iri na asatọ rịa elu mgbe o ruru afọ 2030.
Azụ friji na-amasị ndị Naịjirịa ugbua ebe echere na ọ bụbu nri ndị ogbenye.
Akwụkwọ a FAO depụtara kwuru na ịkụ azụ ejila pasentị iri rịa elu kemgbe afọ iri anọ gara aga.
Ụfọdụ ụzọ ndị mmadụ si-eri azụ
1. Azụ na akwụkwọ nri.
Ebe foto si, @matsecooks
Azụ bụ nri na-adị mma iri ma ọ bụrụ na ị na-achọ ịta ahụ.
2. Ji mmiri ọkụ na azụ.
Ebe foto si, @ntanta_delicacies
Ji mmiri ọkụ bụ nri na-adị nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ mma n'ahụ. Ọ na-atọ ụtọ pụrụiche ma e tinyekwa azụ n'ime ya.
3. Ji na stew azụ
Ebe foto si, Getty Images
Nrị nke a na-amasị ụmụ akwụkwọ karịchaa n'ihi na ọnaghị egbu oge maọbụ ewe nnukwu ego iji sie ya.
Ọ na-amasịkwa ụfọdụ mmadụ na mpaghara Afrịka niile.
4. Azụ a mịrị amị
Ebe foto si, Slippery Lounge
Nke a na-amasị ndị na-apụ ọrịrị, maka na ha na-ejikarị mmanya jụrụ oyi nakwa ihe Bekee kpọrọ 'salad' ata ya.
5. Abacha na azụ
Ebe foto si, Ebere Ekeopara
A gaghị akọwa akụkọ abacha ghara ịkpọta azụ aha.
Ha abụọ na-agakọ ọnụ ka anwụ na ọnwa, maka na ọ bụ ihe e ji atagharị ọnụ ma ị na-ata abacha.