Akụkọ kachasị n'ụtutu a: A ga-ebido ịkpọpụta ụmụaka 12 tọrọ n'ọgba Thailand taa
Akụkọ ndị dị mkpa n'ututu a
Ọrụ ugbo na FUTO
Ebe foto si, PIUS UTOMI EKPEI
Ọrụ ụgbọ na-enye ọtụtụ mba isi ego ha
Iji hụ na nri akọghị nakwa iwebata uru site n'ego, mahadum FUTO ebidola ịkọ ugbo maka orire uru si n'orụ ugbo.
Onyeisi mahadum a bụ Ọkammụta Francis Chukwuemeka Eze, gwara ndị ntaakụkọ nke a n'Owerri.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Futo ebidola ịkọ ugbo maka azụmahịa
Buhari tinyere ọnụ na mmeri Saraki
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadu Buhari etinyela ọnụ na mmeri onyeisi ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa bụ Bukola Saraki meriri n'ụlọ ikpe.
N'ihe Buhari dere na Twitter, o kwuru sị na ugbua Saraki agbarala isi onwe ya, maka na ọ bụrụ na ụlọikpe kachasị na Naịjirịa sị na aka gị dị ọcha, n'ezie ọ dị ọcha.
N'akụkọ mba ofesi
Ebe foto si, Thai Navy
Ebidola usoro ịkpọpụta ụmụaka iri na abụọ na onye nchịkọta ha tọrọ n'ime ọgba kemgbe izu abụọ na mba Thaịland.
Ihe karịrị mmadụ puku gụnyere ndị agha, ndị ọrụ gbatagbata na ndị na-egwu mmiri tinyere aka ịhụ na a kpọpụtara ụmụaka a taa.
Narongsak Osotthanakorn bụ gọvanọ obodo ụmụaka ahụ kwuru sị ka ebido ịkpọpụta ha taa maka imeghara ọdachi ọnọdụ ọjọọ ihu igwe na-abịa.
Cheta na otu onye na-egwu mmiri banyere inyere ụmụaka a aka ụbọchị abụọ gara aga, nwụrụ anwụ.
N'egwuregwu,
Ebe foto si, Getty Images
Nke a bụ mbụ Ịngland na-erute agba a n'asọmpi Iko Mbaụwa kemgbe afọ 1990
Otu Ịngland esonyela mba Frans, Beljịọm na Kroeshia n'agba ọkara ikpeazụ, ka ha gbapụrụ mba Rọshịa bụ ndị hibere asọmpi Iko Mbaụwa, n'abalị.
Ịngland na Kroeshia ga-ezute n'agba nke a ịmata onye ga-agbapụ ibe ya ma ruo agba nke ikpeazụ.
Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri nke taa
Illbliss maka Biafra.