Akụkọ kachasị n'abalị a: Nwaagbọghọ nwụrụ n'ụlọ enyi ya nwoke
ideremmiri gburu mmadụ na Nsukka

Ebe foto si, Getty Images
Ideremmiri na akpa ike na obodo dị ịche ịche ugbua
Akụkọ na-eru BBC ntị na-akọ na ideremmiri egbuola ihe dị ka mmadụ atọ na Nsukka, Enugwu steeti
Mmadụ atọ ahụ nke gụnyere nwatakiri gbara afọ 5 si ụlọakwụkwọ alọta ka ya bụ oke idere mmiri chichapụrụ ụkwụ n'ala ma bụrụ ya na-aga tupu ahụ ya bu ga ụlọ ọgwụ dịka nta akụkọ siri buo.
Azọpụtala mmadụ anọ n'ime mmadụ iri na abụọ idemmiri ribidoro na ọgba Taịland
Ebe foto si, Getty Images
Azọpụtala ụmụaka anọ n'ime ụmụaka 12 tọrọ n'ime ọgba Taịland kemgbe izuụka abụọ.
Na aka ọzọ, nne na nna ụmụrụ ụmụ 9 n'ime 12 bụ ndị tọrọ atọ n'ime ọgba Taịland ka ga-achị obi ha n'aka otu abalị ọzọ. ebe akpọpụtalara mmadụ anọ n'ime ụmụaka ahụ.
A na-elete mmadụ anọ ndị ahụ anya n'ụlọọgwụ ka ọ dị ụgbụa.
Nwaokorobia ahụrụ ozu enyi ya nwanyi n'okpuru akwa
Ebe foto si, Khadijat Oluboyo/Fb
Adenike Khadijat Oluboyo na-agụbu akwụkwọ na Adekunle Ajasin University bụ ebe o kwesiri ịpụta n'afọ ọzọ.
Ndị ụweojii agbala ama ka otu nwaagbọghọ bụ nwa osote gọọvanọ ondo steeti chibugoro ka ahụru ozu ya n'okpuru akwa enyị ya nwoke.
Adenike Khadijat Oluboyo bụ onye a na-achọ achọ kemgbe abalị 6 ka atụrụ anya na ọ ga agụcha akwụkwọ ya na afọ ọzọ gara ihu enyi ya nwoke akpọrọ Adeyemi Alao.
N'egwuruegwu Iko mbaụwa
Fernando Hierro etinyele akwụkwọ arụkwaghị na Spen
Ebe foto si, Getty Images
Fernando Hierro gbabụrụ Spen, Real Madrid, Bolton Wanderers na ndị ọzo tupu oduru Spen gawa iko mbaụwa bụ ebe ọrụ ya nọ kụọ
Kochi ndị Spen bụ Fernando Hierro achiliela aka ka achụpụchara ha n'Iko Mbaụwa. Rọshịa ji penariti gbapụ spen na ịzuụka gaara aga.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Lee ihe nkiri anyị
Nwafọ Igbo a ma ama n'egwu agụpụtala ihe ise ọmere nwere bụrụ ọkaibe na egwu mbem bekee