Igbo enweghi oke ala maka ịchị ehi - Ndị gọvanọ

Ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa-anyanwụ

Mkpebi dị iche iche pụtara ihe site na mkparịta ụka ndị gọvanọ mpaghara ọwụwa-anyanwụ nke Naịjirịa mere ụnyaahụ n'Enugwu.

Mkpebi ndị a gụnyere na steeti ha enweghi oke ala ọbụla maka ihiwe ogbe ebe a na-achị ehi dịka ha kwuru na ha enweghi ala zuruoke maka ọrụ ngo.

Nke a dị na-akwụkwọ ozi onyeisi ha bụ Dave Umahi wepụtara n'ime mkparịta ụka ha mere ụnyaahụ.

O kwuru na gọọmentị etiti asịbeghi ha wepụta ala maka na ha mara na ala dị na mpaghara a ebughi ibu.

Umahi kwuru na ha agaghi amapụta oke ala ọbụla ma ọ bụrụ na gọọmentị etiti asị ha wepụta ala.

Ha rụtụrụ aka n'oke ogbugbu ndị mmadụ na-aga n'ihu na Naịjirịa ma kwupụta ụjọ ha nwere na nke a nwereike imetụta steeti ha n'otu ụbọchị.

Ha kpọrọ oku ka ha na ndị isi ụlọọrụ nchekwa dị iche iche, ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ugbo nwee mkparịta ụka n'atufughi oge, iji gboo nsogbu ndị a.

Ndị ọzọ so na mkparịta ụka a bụ Ohanaeze Ndigbo, Ndị eze ọdịnala, na ndị isi ụlọọrụ dị iche iche.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: