Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: FIFA ga-enyocha Vida maka okwu megidere Rọshịa

Akụkọ ndị dị mkpa

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Saraki chịrị afọ asatọ dịka onye Gọvanọ kwara Steeti

Onyeisi ndị ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki ga-akpọrọ ndị otu ya ndị ọzọ gaa njem nleta n'ụlọ ndị omeiwu mba Amerịka taa.

Ihe ndị ha ga-arụtụ aka na njem a gụnyere nwulite mmekọrịta ndị omeiwu na usoro ọchịchị mba Naịjirịa na mba Amerịka.

Ebe ọzọ na Naịjirịa

Ndị gọvanọ na-achị mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ekwuola n'onweghị oke ala ha nwere maka ọrụ ngo ma ọfụdụzie ogbe ebe a na-azụ ehi

Okwu nke a bụ ihe pụtara na-akwụkwọ ozi onyeisi ha bụ Dave Umahi wepụtara n'ime mkparịta ụka ha mere ụnyaahụ.

Na mba ofesi,

Image copyright AFP

E chere na mmadụ ruru otu narị anwụọla ebe iri na ise na-efu efu na mpaghara ọwụwa-anyanwụ mba Jaapan n'ihi oke mmiri ozuzo nke butere oke idemmiri.

Mmiri ozuzo a malitere kamgbe abalị ise gara aga ji ugboro atọ karịa etu mmiri si ezo n'ebe ahụ n'ime ọnwa Julaị.

N'Egwuregwu

Image copyright Getty Images

FIFA ebidola ime onye ọgba bọọlụ mba Kroeshia akpọrọ Vida nyocha maka okwu megidere mba Rọshịa o kwuru n'ihe onyonyo.

N'otu aka ahụ ngalaba na-achịkọta egwuregwu bọọlụ na Brazil adọọla ndị Brazil aka na ntị maka ị kpa oke agbụrụ megide onye otu egwurewgwu ha bụ Fernadinho maka ọkpụ o nyere megide ha n'asompị iko mba ụwa.

Gee akụkọ ndị mere taa n'ịchafụ

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe onyonyo nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIllbliss maka Biafra.