Ihe NLC ji gbachie MTN na steeti dị icheiche

Ndị ọrụ Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Otu NLC bụ otu na-agba mbọ maka ọdịmma ndị ọrụ

Otu abụghị otu gọọmentị na-ahụ maka ihe gbasara ndị ọrụ Naịjirịa bu nke akpọrọ Nigerian Labour Congress (NLC) n'asụsụ Bekee agbachiela ụlọọrụ MTN, bụ ndị na-enye olu ekwenti na steeti dị icheiche na Naịjirịa.

Ndị NLC sị na ihe ha na-eme na ụlọọrụ MTN bụ maka "ụlọọrụ a adịghị eme ihe ha kwesiri imere ndị ọrụ ha na Naịjirịa".

Mgbachịe ha na-eme na MTN ga-eru ụbọchị atọ.

Ha kwuru na MTN ji ndị Naịjirịa eme odibo ma na-akwụ ha ụgwọ na erughi ihe ha kwesiri ịkwụ ha.

Ụlọ ntaakụkọ Guardian dere na onyeisi ndị NLC n'Enugwụ bụ Virginus Nwobodo sị na ndị isi MTN ekweghi ka ndị ụlọọru ha soro ndị NLC maọbụ otu dị ka ya.

O kwukwara na ha ekweghị ige ntị mgbe niile ha chọrọ ha ga maka okwu a.

Nkenke aha onyonyo Ndị NLC sị na ndị MTN na-emegidi ndị ọrụ ha na Naịjirịa

Ndị mmadu na Twitter na-egosi ihe ha hụrụ mgbe ha zutere mgbachi a ndị NLC na-eme n'ụlọọrụ MTN. Lee ihe ụfọdụ kwuru.

@Jimlayinka tinyere ihe onyonyo a na Twitter

@michaed2012 tinyere foto ndị a na Twitter.

@solacebase tinyere onyonyo a ọ sị si Kano

@Gbenga4Glory tinyerkwara nke Kano.

Ndị MTN na onwe ha asaala ihe a na-eme ma kwuo na mmebi ha mebiri akụnaụba ha bụ ihe iwe.

Ha kwukwara, site n'ozi a ha zịpụrụ na Twitter ha na onwere ndị ọrụ ha emerụrụ ahụ, ma kwuo na onweghị mgbe ha jiri kwụsị ndị ọrụ ha iso ngalaba ọbụla ha chọrọ iso.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a