US: Kwụsịnụ igbu ndị mmadụ na Naịjirịa

Gọvanọ Lalong na david Young Image copyright @simonlalong

Osote onyeisi ozi ụlọ nnọchite anya mba Amerịka na Naịjirịa bụ David Young kwara gọọmentị etiti ka ha kwụsị ogbugbu ndị mmadụ ma nwụchie ndị aka ha dị na ya.

Young kwuru na ndụ bụ ihe dị nsọ agbanyeghi ogogo, agbụrụ maọbụ okpukperechi onye ahụ.

O kwuru nke a mgbe o mere njem iti aka n'obi n'isi ọchịchị Platu steeti bụ Jọs ebe ọ hụrụ Gọvanọ Simon Lalong nke steeti ahụ ụnyaahụ.

Young na ndị otu kasiri ndị Platu Steeti obi maka ogbugbu ndị obodo ha mere na nso nso a.

Ọ rụtụrụ aka ka ndị mmadụ na-ekwupụta udo na ị dị n'otu mgbe niile.

Image copyright @Simonlalong

N'okwu ya " Ndụ dị nsọ, agbanyeghi ebe mmadụ ọbụla si pụta, ma ịbụ ọchị ehi, onye ọrụ ugbo, ndị ụka kraịst ma ọ bụ nke alakụba.

"Tigbuo zọgbuo bụ okwu dịrị gọọmentị steeti ma ọ bụ nke etiti, ekwesiri ịgba mbọ gbochie ya."

Na nzaghachị Gọvanọ Platu steeti bụ Simon Lalong gwara ya na gọọmentị na-agba mbọ igbo nsogbu a.

O gwara ya na gọọmentị etiti na mba ụwa niile ga-ekpe ndị anwụchiri ikpe ma taa ha ahụhụ ruru ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: