Etu nwaanyị siri kwaa odibo ya mmiri ọkụ

Nwata nwaanyị bu apa n'ahụ ya.

Ụmụnwaanyị atọ agaala mkpọrọ na Pọtakọtụ(Port-Harcourt) dịka onye ọkaịkpe ukwu nụchara etu ha si emegbu ndị odibo ha.

Nwaanyị nke mbụ jiri mmiri ọkụ etinyere ose kwaa n'ahụ nwata odibo ya dị afọ iri.

Onye nke abụọ kwara nwata dị afọ iri na anọ ya na ya bi mmiri ọkụ, ebe nwaanyị nke atọ ji mma dị ọkụ ti nwata odibo ya ihe ma tinye kwa ya ose n'ike.

Mgbe ụlọịkpe nụchara ịkpe a nke otu ụmụnwaanyị ndị okaiwụ bụ FIDA n'aha ịchafụ bugara ụlọịkpe na Rivas steeti, onye ọkaikpe ukwu ahụ ekpebie n'ụmụnwaanyị ahụ ga-anọ n'ụlọ mkpọrọ rue mgbe a ga-anụ ihe gbasara okwu a ọzọ.

Anthonia Osademe bụ onyeisioche otu ndị ọkaiwu ụmụnwaanyị nke a kpọrọ 'FIDA' nke Rivas steeti kwuru na uche ndị mmadụ ebidola ị ga n'ihe gbasara mmegbu odibo na ebe ha nwere ike ị ga mkpesa maka ya.

O kwukwara na ọtụtụ ndị mmadụ ebidola ị bịa n'ụlọọrụ ha ma na-agakwa n'ụlọọrụ ndị uweojii ekpesa maka mmegbu ọbụla ha hụrụ.

Osademe kọwara na ọ bụ ndịnkuzi na ndị agbataobi gwara ha bụ FIDA na ndị uweojii maka akụkọ ndị a.

N'ọnụ ya, "Na agbanyeghị na ụdị okwu a na-ebute nwute, ọ bụ ndị mmadụ dịka mụ na gị bịara kọrọ anyị akụkọ a. Ụmụaka ndị odibo nwere ikikere dịka ụmụaka ọzọ n'ala Naịjirịa."

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a