Etu APGA si gbalahụ isonye na CUPP

Willie Obiano bụ Gọvanọ Anambra steeti bụ onye otu APGA Image copyright WillieObiano/Facebook
Nkenke aha onyonyo Willie Obiano bụ Gọvanọ Anambra steeti bụ onye otu APGA

Otu 'Peoples Democratic Party' (PDP), otu R-APC nakwa ọtụtụ pati ndị ọzọ ebinyela aka n'akwụkwọ nkwekọrịta nke Bekee kpọrọ 'Memorandum of Understanding' iji bịakọta ọnụ.

Pati ndị ọzọ so n'ime otu ọhụrụ a bụ SDP, NCP na ụfọdụ ndị ọzọ mana APGA esoghi n'ime ha.

Mgbe BBC gbara APGA ajụjụ ọnụ ihe mere ha ejighi sonye otu ọhụrụ a, Victor Ike Oye bụ onyeisi oche pati a kwuru na ọ bụghị iwu na pati niile ga-esonye na nke ọhụrụ ahụ.

N'ọnụ ya "ọ bụ iwu na APGA ga-esonye ihe ọbụla otu ndị ọzọ na-eme?"

Maka ọdịnihụ APGA, o kwuru na ha dị njikere maka ntuliaka ga-eme n'afọ 2019.

Oye kwuru na "ntuliaka bụ agha, onye na-eje agha anaghị egosi atụmatụ na nkwado ya niile tupu alụọ agha".

Image copyright INEC official Facebook page
Nkenke aha onyonyo Victor Umeh, onye meriri ntuliaka Sineti ndị Anambra ebe mpaghara Etiti nke e mere n'ụbọchị 16 Jenụwarị, 2018

Kedu otu ndị sonyere n'otu ọhụrụ "CUPP"?

Ihe ruru otu ndọrọndọrọ ọchichị iri atọ bụ ndị pụtara ikwado nakwa isonye n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọhụrụ n'Abuja ụnyaahụ.

Ndị a gụnyere:

  • Action Alliance (AA),
  • Alliance for Democracy (AD),
  • Africa Democratic Party (ADC),
  • Action Democratic Party (ADP),
  • All Grand Alliance Party (AGAP),
  • Action Peoples Party (APP),
  • Advanced Congress of Democrats (ACD),
  • Better Nigeria Progressive Party,
  • Democratic Alternative (DA),
  • Democratic Peoples Party (DPC),
  • Grand Democratic Party of Nigeria (GDPN),
  • Green Party of Nigeria (GPN),
  • KOWA Party, Labour Party (LP),
  • Mass Action Joint Alliance (MAJA),
  • Masses Movement of Nigeria (MMN),
  • National Conscience Party (NCP),
  • New Generation Party (NGP),
  • National Unity Party (NUP),
  • Nigeria Intervention Movement (NIM),
  • Peoples Alliance for National Development and Liberty (PANDEL),
  • Peoples Progressive Party (PPP),
  • People for Democratic Change (PDC),
  • Peoples Democratic Party (PDP),
  • Providence People's Congress (PPC),
  • Reformed All Progressive Congress (RAPC),
  • Restoration Party of Nigeria (RPN),
  • Social Democratic Party (SDP),
  • Unity Party of Nigeria (UPN),
  • All Grassroots Alliance (AGA),
  • National Interest Party (NIP),
  • Nigeria Democratic Congress Party (NDCP),
  • Progressive Peoples Alliance (PPA),
  • Young Democratic Party (YDP)

Etu njịkọ a ga-esi rụ ọrụ

Image copyright Twitter/PDP

Ajụjụ dị ụfọdụ mmadụ n'ọnụ bụ etu otu ọhụrụ a a ga-esi rụọ ọrụ nakwa họpụta otu mmadụ ga-azọ ọkwa ọchịchị n'aha ha.

Otu ọkachamara n'ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ Japhet Omojuwa kọwaara BBC etu njịkọ pati ndị a ga-esi rụọ ọrụ.

N'ọnụ ya 'njịkọ ndọrọndọrọ adịghị emeri otu pati ji ọkwa ọchịchị mana o nwereike ime n'afọ'. O kwukwara na ha emeghị njikọ a n'oge.

Ọzọ, Omojuwa kwuru na n'ime njiko a, e nwere ụfọdụ ndị na-achọ ịzọ ya bụ ọkwa ọchịchị, ọ sị na nke a nwereike ibute esemokwu n'etiti ha.

Ọ dụrụ ha ndụmọdụ ha jiri nwaayọ chee echiche n'ime onwe ha ma ha nwereike imeri ntụliaka nke 2019 tupu ha emee ihe dị na ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a