E nwereike ịgbachi akwa mmiri 'Third Mainland'

Akwa mmiri Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A rụrụ akwa mmiri 'Thirdmainland' na 1990 n'ọchịchị Ibrahim Babangida

Gọọmentị etiti ga-agbachi akwa mmiri ''Third Mainland'' nke dị na Legọsị.

O kwuputere ihe a site n'ọnụ onye na-ahụ maka ọrụ okporouzọ na Legos akpọrọ Adedamola Kuti.

Kuti kwuru na a na aga-enwe mkparịtaụka maka ịgbachi ma mezie ya bụ akwa mmiri.

Akwa mmiri a bụ ebe ọtụtụ ndị bi na 'Mainland' sị ebi ije ha nke nke ma ha na-eje ''Island'' ma bụrụkwa ebe esi eje ọtụtụ ụlọ azụma ahịa na ọrụ bekee dịkwa.

Kuti kwukwara na ndị ọnụ na-eru n'okwu ga-ezukọ taa ka ha wee kpaa ka a ga-esi gbochie ntaramahụhụ mmezi a nwereike ibutere ndị ọkwọ ụgbọala nesikarị ụzọ ahụ agafe.

O kwughị oge a ga-agbachị okporoụzọ akwa mmiri a maọbụ mgbe a ga-ebido mezi we ya mana o kwuru na e nereiek ị gbachi ya na elekere 12 nke nderi nke ụbọchị Julai 12 ka ha wee lele ya ọfụma ma mezitu ya tupu ha emepe ya ụbọchị ụka n'ime abali.

N'ọnụ ya, ''ndị ọnụ na-eru n'okwu ga-abia nzukọ a gụnyere ndị ọrụ nhazi ụgbọala na-aga n'okporoụzọ,ndị na-ahụ maka njem okporoụzọ, ndị na-akwọ gwongworo nakwa ndị ọkwọ ụgbọala, ndị uweojii na ndị ọzọ.

Na ọnwa May nke afọ a , Ka ndị so n'oche ochịchị onyeisiala akpọrọ Federal Executive council na bekee binyere aka n'akwụkwọ kewapụtara ọnụ egọ Ijeri naira 18 na ọkara maka mmezi na nchekwa akwa mmiri a.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara