Akụkọ dị mkpa n'ịchafụ: Amanyela Facebook iwu ikwụ pound 500,000

Akụkọ ndị dị mkpa.

Buhari akatọọla ndị na-ata ya ụta

Onyeisiala Mohammadu Buhari akatọọla okwu ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchị na-ekwu na ọgbara nkịtị n'ihe gbasara ogbugbu ndị mmadụ na Naịjirịa.

Buhari kwuru nke a n'ọgbakọ ndọrọ ndọrọ ndị APC mere n'Ekiti Steeti ụnyaahụ iji kwado kayode Fayemi ịbụ gọvanọ steeti ahụ.

Ụka Angịlịkan adụọla Buhari ndụmaọdụ

Nkọwa foto,

Ụka Angịlịkan nọ na mba karịrị otu narị iri isii na ise n'ụwa niile

Ndị ụka Anglican nke Nnewi Dayọsis agwala onyeisiala Buhari ka o chegharịa echiche n'atụmatụ ya ị pụtagharị n'ọkwa ọzọ.

Nke a dị n'ozi ụkọchukwu Godwin Okpala wepụtara kwuo na ụfọdụ na-ahụ ya dịka ogbunigwe nchere oge.

United Kingdom ga-eri Facebook iwu

Nkọwa foto,

Cambridge Analytica bụ ụlọọrụ mba Britain na-ahụ maka ichekwa ozị

Ngalaba na-ahụ maka nchekwa data na United Kingdom ga-eri ụlọọrụ Facebook iwu ego ruru paụnds puku narị ise maka ị da iwu nchekwa data

Kọmishọna na-ahụ maka ozi kwupụtara nke a mana ụlọọrụ Facebook kwuru na ha ga-asa okwu n'oge na-adịghị anya.

Egwuregwu:

Gee nkeji nke ụtụtụ a:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe onyonyo nke taa:

Aha onyonyo,

'Ụmụnwaanyị bụ ndị na-ejekarị ebe a na-eburu ha amụma' - Bishop Chukwuma